Ankara white Wedding: Ihe mere m ji were uwe puruiche kwaara onwe m akwa agbamakwụkwọ - Chioma Inyang
Chioma Inyang gosiri na ọ bụ nwa ada Igbo n'eziokwu oge o ji ankara kwaara onwe ya uwe agbamakwụkwọ.
Uwe agbamakwụkwọ so n'otu ihe na-echu nwa agbọghọ ọbụla ụra.
Onye ọbụla na-achọ ka nke ya bụrụ ọpụrụ iche nakwa ọkacha mma.
Mana Chioma Inyang, onye ọkwa akwa, hapụrụ omenala ndị ọcha, ma were akwa ndị Afrịka kwaara onwe ya uwe bụ sọ mma.
Gere akụkọ ya n'uju n'onyonyo dị n'elu.
Ndị mere ya bụ Chimezie Ucheagbo na Chiemela Peter




