Etu nwata nwaanyị dị afọ iri n'Ede-Oballa Nsukka si nwụọ n'aka ndị omekome dinara ya n'ike
Ezinaụlọ Ezeh n'Ede-Oballa Nsukka ji anya mmiri were na eru uju ọnwụ nwa ha nwaanyị Nkemdirim Ezeh nke ndị omekome gburu n'ụbọchị Tuzde gara aga(June 29, 2022).
Di ọkpara ya bụ ezinaụlọ bụ Ejike Ezeh gwara BBC na Nkemdirim gbara afọ iri na otu bụ nwa ikpeazụ nne ya.
Ejike kwara akwa arịrị na ha chọbara ya bụ nwa oge ya na nne ya gara ime akwụ.
O were ndị obodo niile mkpụrụ ụbọchị ole ma ole tupu ha ahụ ọzụ nwatakịrị ahụ.


Ejike kwuru na ndị uweojii gwara ha ka ha lie ya, ka ha (ndị uweojii) nwee ike chọpụta ebe mmiri siri baa n'opi ụgbọgịrị.
Ọ bụzị n'ụbọchị Mọnde ka e jidere otu nwata nwoke e boro na ọ bụ dibịa ya na ya soro gbuo nwa ahụ.
Ngwa ngwa ndị 'neighbourhood watch' bụ ndị nche n'ogbe jidere ha ka ndị ntorobịa wee muye ha ọkụ.

Nne nwata ahụ bụ Lọlọ igwe kwuru na onye gburu nwa ya napụrụ ya onye nkasi obi ya.
O ji anya mmiri kwuo na njide e jidere ndị kpara ike ọjọọ ahụ bụ Chineke zara ya ekpere okpere tupu elie nwa ya nwaanyị.
Ndị obodo juputara na be ya bụ nwatakịrị na agbatara ha mkpụ akwa.








