Roe v Wade: Etu mmachi Amerika machiri ite ime ga-esi metụta ụmụnwaanyị Naijiria

Ndị na-eme ngagharịiwe maka ikike nwaanyị ite ime

Ebe foto si, EPA

Otu ndị na abụghị nke gọọmentị na-agba mbọ maka ikike dịị ụmụnwaanyị na Naijria ekwuola na mkpebi ahụ nke Ụlọikpe Kachasị na mba Amerika nyere ụbọchị Fraide nke machiri ikike nwaanyị ite ime ga-ebutere ụmụnwaanyị nsogbu ahụike.

Ụlọikpe Kachasị nke Amerịka nọrọ n'ụbọchị Fraide(24/6/2022) kagbuo ikike ụmụnwaanyị nọ na mba ahụ nwere ite ime .

Onye nchịkọta ngalaba ikike dịrị ụmụnwaanyị (Manager, Women's Right Program)nke ụlọọrụ Actionaid Nigeria bụ Nkechi-Ilochi-Omekedo kwuru na " iwepụ ohere ụmụnwaanyị ite ime mgbe ọ dị na mkpa ga-eme ka ọtụtụ ndị chọrọ ya malite ite ime azụ ụlọ nke nwere ike iti ha na nnukwu nsogbu ahụike dị iche iche maọbụ ọnwụ".

"Ọ ga-eme ka ọtụtụ mụọ nwa ha ga-akpọ asị ọkachasị ma ọ bụụ na-awakporo ha n'ike ha were dị ime."

"Nke a ga-emekwa ka uru nile na mbbọ nile a gbarala n'okwu inye ụmụnwaanyị ikike dịị ha ga-ala n'iyi."

Ite ime megidere iwu na Naijiria mana ọtụtụ ndị na-agba mbọ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị etinyela ọtụtụ afọ n'ịgba mbọ ka e tinye ya n'iwu ụmụnwaanyị inwe ikike ite ime ma ha chọọ.

Mkpebi ahụ bụ ihe ọma mere ụwa- Ụka Katọlik

Mana dịka ndị na-agba mbọ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị na-atụ arịri maka mkpebui ahụ, Ụka Katọlik na ndị akwadoghị ite ime kwuru na ọ bụ nnukwu ihe ọma mere ụwa.

Ọnụ na-ekwuru ụka Katolik na Dayọsis Enugwu bụ Fada Benjamin Achị gwara BBC Igbo sị, " Mkpebi ahụ bụ otu n'ihe kachasị mma mere Amerịka na ụwa gba gburugburu."

O kwuru na ikpe Woe na Wade ahụ e biri n'afọ 1973, bụ mpụ ka ọchịchị mba Amerịka mere megide ezinaụla nakwa mmadụ. " Mmkebi ahụ s gosiri na a ka nwere nkwanyere ugwu nye ndụ mmadụ nke bụ ihe ọma kacha ibe ya."

US Supreme Court : Ụlọikpe Kachasị nke Amerịka akagbuola ikike nwaanyị ite ime

Ndị na-eme ngagharịiwe maka mwepụ ikike ụmụnwaanyị ite ime

Ebe foto si, Reuters

Ụlọikpe Kachasị na Amerịka anapụla ụmụnwaanyị nọ na mba ahụ ikike ite ime dịka ụlọikpe ahụ kụpụrụ mkpebi e tinyere afọ 50 gara aga.

Mkpebi ahụ (nke ọkaikpe asaa kwenyere na ya, ebe abụọ jụrụ ajụ) nke e kwubiri n'afọ 1973 n'ikpe dị n'etiti Roe na Wade nyere nwaanyị ikike iwepụ afọime nke iwu mba Amerịka kwadoro.

Mkpebi nke taa ga-agbanwe ikike nwaanyị nwere ite ime dịka steeti ọbụla dị n'Amerịka ga-enwezi ike ịmachi iwepụ afọ ime.

A na-ele anya na ọkara steeti dị na mba Amerịka ga-amalite ịmachi ite ime.

Ka ọ dị ụgbụa, steeti 13 etinyela iwu ga-akpalite mmachi ahụ.

Kedụ ikpe dị n'etiti Roe na Wade?

Ndí na-eme ngagharíiwe

Ebe foto si, Reuters

N'afọ 1969, otu nwaanyị alụbeghị di gbara afọ 25 bụ Norma McCorvey mana e nyere ya aha otutu "Jane Roe", gbara akwụkwọ iji gbaghaa iwu machiri ite ime dị na Texas.

Steeti ahụ machiri ite ime dịka ihe megidere iwu belụsọ ma ndụ nwaaanyị bu afọ ime ọ‘ nọ na nsogbu.

Mana n'ikwado iwu machiri ite ime, Ọkaukwu ukwu(district attorney) nke Dallas County bụ Henry Wade nke mere ka a kpọwa ikpe ahụ ikpe dị n'etiti Roe na Wade.

Roe onye dị ime nke atọ kwuru na ọ bụ mwakpo ka a wakporo ya mana a jụụ ike ya nke mere ka ọ mụọ nwa ahụ.

N'afọ 1973, ọ gbagharịrị akwụkwọ nke mechara ruo Ụlọikpe Kachasị ebe e kpere ike ya nakwa nke nwaanyị onye Georgia aha ya bụ Sarah Bensing.

Ha abụọ kwuru na iwu megidere nwaanyị ite ime megidere ikike nwaanyị ịnọrọ onwe ya.

Kedụ ihe ikpe Roe na Wade gbanwere?

Ikpe Roe na Wade gbanwere ọtụtụ ihe banyere ikike ụmụnwaanyị.

Nke a gụnyere:

  • Ikpe ahụ wepụtara usoro ọnwa atọ : Nke a nyere nwaanyị ikike gbowam iwepụ nime ọbụla dị ọnwa atọ.
  • E tinyetụrụ iwu na iwepụ afọ ime banyerela n'ọnwa atọ nke abụọ(4-6 months)
  • Ụfọdụ steeti machiri maọbụ tinyetụ iwu n'ikike ite ime gaferela ọnwa isii.
  • Mkpebi ikpe Roe na Wade na-ekwu na nwaanyí nwere ike ite ime karírí ónwa isii na agbanyeghị mmachi ọbụla ma ọ bụrụ na dọkịta kpebie na ọ dị mkpa iji zọọ ndụ