Ihe ndị uweojii kwuru maka nwaanyị a sị tụnyere ụmụatọ agbataobi ya n'ụmị mmiri n'ihi ntụnye otu nwa ya

Foto ụmị mmiri
Nkọwa foto, Foto ụmị mmiri a bụ nke e ji akọwa akụkọ a, ọ bụghị ebe ya bụ ihe mere

Ndị uweojii Nasarawa steeti ekwuola na ha amaghị ihe ọbụla gbasara akụkọ na a tụbara ụfọdụ ụmụaka n'ụmị mmiri na steeti ahụ.

Ramhan Nansel bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, gwara BBC na ndị uweojii anatabeghi mkpesa maọbụ ozi ọbụla gbasara ya bụ akụkọ fesarala na soshal midia.

Nansel kwuru na ha agagharịala mpaghara dị iche iche na Mararaba (ebe a sị na ya bụ ihe mere) n'ime ụbọchị atọ kemgbe akụkọ ahụ pụtara, ịma ma e nwere etu ha ga-esi chọpụta ebe ya bụ ihe mere.

O kwukwara na ha anwaala isi n'ọnụ nwaada zipuru ozi a na soshal midia nụta kpọmkwem ebe ya bụ akụkọ mere, mana nke ahụ amịtabeghi mkpụrụ.

Nke a na-abịa dịka otu onye kpọrọ onwe ya @TokyosBite, dere na Twitter na otu nwaanyị tukpuru ụmụ niile onye agbataobi ya mụrụ n'ime ụmị mmiri iji bọgwara ọbọ nke o mere ya.

O kwuru na nwaanyị ahụ tụbara ụmụaka ahụ, hụrụ na onye agbataobi ya bu ụzọ tụba otu mkpụrụ nke o nwere n'ime ụmị mmiri ahụ.

Ihe mmadụ dere gbasara akụkọ a

Ebe foto si, Screenshot

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii kwuru na ha ka na-agba anya ka tọọchị ịma ma ha a ga-achọta ebe ya bụ ihe mere n'ezie.