Etu ụmụakwụkwọ abụọ si kubie n'ụgbọala ụlọakwụkwọ n’ihi enwetaghị ikuku

Ebe foto si, Handmaids International Catholic School,
Ndị uweojii Legọs steeti ekwuola na ha na-enyocha ọnwụ ụmụakwụkwọ abụọ kubiri n’ihi enwetaghị ikuku dịka ọkwọụgbọala ụlọakwụkwọ ha si ụlọakwụkwọ akwọla ụmụakwụkwọ karịrị 20 na Legọs, oge ọdachi ahụ dabidoro ha.
Izuorah Sochima Victor dị afọ asatọ na Ilofulunwa Ugomsinachi dị afọ iri na otu bụ ụmụakwụkwọ ‘Handmaids International Catholic School', dị n' Aguda, Surulere Legọs nwụrụ dịka ọkwọụgbọala ụlọakwụkwọ ha si ụlọakwụkwọ ha akwọla ha n'abalị asatọ nke ọnwa Julai afọ, 2022.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC Igbo na ọ bụ "etinyeghị uche n'ọrụ" nke ọkwọụgbọala ahụ butere ọnwụ ụmụaka ụmụakwụkwọ abụọ."
Hundeyin sịrị, "Anyị ga-eme nyocha iji mata nma ụmụaka ahụ akwụụ site n'ikubi maka enwetaghị ikuku maọbụ ma e nwere ọrịa dị ha n'ime ahụ. ma wepụ okwu ahụ ụlọikpe."
Dịka akwụkwọakụkọ 'Vanguard siri kwuo, ọkwọụgbọala a kpọrọ Odunsi Olurotimi Valentine, a ma dịka "Uncle Mandela" na-akwọla ụmụaka kpọchiri windo ụgbọala nke mere na ụmụaka nọ n'ụgbọala ahụ ekuteghị ume.
Otu nwatakirị nwanne ya nwụrụ gwara Vanguard na ya kpọrọ ọkwọụgbọala ahụ gwa ya na nwannne ya na-ama jiji, ya mepe windo mana o geghị ha ntị ka ma ọ kwọọ ha rue ebe ọ kwụsịrị otu nwatakwụọ.
O kwukwara na ya chere na nwanne ya nọ n'ụra, na ya amaghị na ọ nwụọla.
N'aka nke ọzọ, Ọkwọụgbọala tụrụ arịrị si na ọdachi ahụ bụ na amaghị ama.
O kwuru na ya egeghị ụmụaka ahụ ntị oge ha na-agwa ya okwu maka windo n'ihi na ya chere na ha na-ama ya njakịrị(prank).
Ọ kọwara na ọ bụ mmiri ozuzo mere ka ya gbachie windo ụgbọala ahụ.
O kwuru na " oke mmiri zoro ụbọchị ahụ, ide mmiri tochie ebe n'ile.
"Taya ụgbọala dara afọ m gawa ịchọta onye ga-etinye ya ikuku, gbachie ugegbe ka ndị ntọ ghara ịtọ ha."
O kwuru na oge ọ pụtara, ọ bụụ na ụfọdụ ụmụaka ahụ arahụla, ebe ụfọdụ na-agbọ agbọ, ọ gbara buga ha ụlọgwụ.
A zọtara ndụ ụmụaka 23 n'ime ụmụaka ndị ahụ ihe a metụtara.
Nne Victor bụ Oriakụ Ebere Izuorah gwara Vanguard n' anyammiri na ya mụtara Victor ka ya chọchara nwa afọ isii.
Ndị isi ụlọakwụkwọ 'Handmaids International Catholic School, tụrụ arịrị maka ihe mere ma kwụọ na ọ bụghị ụgbọala ụlọakwụkwọ ha bu ụmụaka ahụ kama ọ bụ mkpebi ndị nne na nne na ọkwọụgbọala ahụ nwere.
Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Rev Sir Mary Okolo kwụrụ na ha agala nleta ezinaụlọ ndị ọdachi ahụ dagidere.








