Etu ọkụ si gbagbuo ụmụnne atọ na Port Harcourt

Aha onyonyo, Port Harcourt Fire: Etu ọkụ si na 'candle' si gbagbuo ụmụaka abụọ na Port Harcourt
Etu ọkụ si gbagbuo ụmụnne atọ na Port Harcourt

Ụmụaka atọ si n'otu ezinụlọ anwụọla n'ime ihe mberede ọkụ ọgbụgba na mpaghara Rumuchakara, nke dị n'okpuru ọchịchị Obio-Akpor na Rivas steeti.

Nna ụmụaka atọ a bụ Solomon Ewekwe gawara BBC na ọ maghị etu ya bụ ọkụ si malite n'ime ụlọ ebe ụmụ ha dina.

Ọ bụ n'ụbọchị Mọnde, Sepụtemba 26 ka ihe mberede a mere.

"Anyị nọ na-arahụ ụra, ihe ọzọ m nụrụ bụ ka nwunye m na-eti mkpu, ọkụ! ọkụ! ọkụ."

"Anyị gbagara ka anyị zọpụta ụmụ m, mana naanị atọ n'ime ha ka anyị nwenwuru ike ịzọpụta, ebe atọ ndị ọzọ nwụrụ n'ọkụ ahụ."

"Ọdị m ka m soro ụmụ m ndị a nwụọ. Achọrọ m ịgbakpu n'ime ọkụ ahụ ka m soro ha nwụọ, maọbụ pụọ n'iro ka ụgbọala kụgbuo m, mana ndị mmadụ jigidere m."

Solomon Ewekwe kwuru na otu n'ime ndị nwụrụ n'ọkụ ahụ bụ nwa nwanne ya bịara ezumike n'ụlọ ya, mana ọ chọghịzi ịlaghachi n'obodo.

"N'ụbọchị Mọnde ka m denyere aha ya n'ụlọakwụkwọ ebe a," ka o kwuru n'anyammiri.

Ọkụ

Otu onye agbatobi hụrụ ihe merenụ kwuru na o nwereike ịbụ ọkụ 'candle' ụmụaka ahụ mụnyere iji dee ihe e nyere ha n'ụlọakwụkwọ kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ.

Nwaanyịa a aha ya bụ Adaeze Chima kwuru na ọ bụ oge ụmụaka ahụ malitere iti mkpu na-akpọku nne na nna ha ka ndị mmadụ ji gbapụta inyere ha aka.

"Ọ bụ n'ebe elekere itoolu nke abalị ka anyị nụrụ mkpu ahụ n'ụlọ ha. Onye ọbụla gbapụtara mana enweghị ebe anyị nwereike isi banye, n'ihi na ọkụ na anwụrụọkụ ejupụtala ebe niile," Adaeze kwuru.