Election 2023: Gini butere nsogbu n'etiti ndị ntorobịa na Peter Mbah nke PDP n'Enugwu?

Peter Ndubisi Mbah

Ebe foto si, Peter Mbah/Facebook

Nsogbu dapụtara n'etiti ụfọdụ ndị ntorobịa na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP nke Peter mbah na azọ Gọvanọ na ya ụnyaahụ march 4th 2023.

Nwamadị Jude Ogbonna kọọrọ BBC na nsogbu ahụ malitere mgbe Peter Mbah bịara n'ụlọụka katọliki dị na Ugwu-dị-nsọ Eke ịgwa ndị ntorobịa gbakọrọ ebe ahụ ka ha tụnyere ya vootu na ntuliaka na-abịa n'ụbọchị Satọde

Ngwa ngwa ụkọchụkwu kpọpụtara ya, ndị ntorobịa jiri iwe na eti mkpu onu na asị "Obi, Obi" ha ekweghị ya kwuo okwu.

Mazi Peter Mbah gara nọrọ na "Parish House" ganye na ebe niile edere juu.

Ndị ntorobia ahụ meere ọgbaaghara gaa na okporoụzọ na abata ya bụ ụlọ Ekpere n'eme ngagharị iwe.

Ndị otu “Peter Mbah campaign organization" boro ebubo kwuo na ọbụghị ndị bịara ụka kpara ya bụ ọgbaaghara kama na ọ bụ ndị otu Labour pati kpọtara ndị omekome ahụ.

Ha kwuru na ndị Labour pati kpọtara ndị agboro ha n'ụlọ ụka ka ha meruo mmadụ ahụ.

Ha mebiri otu ụgbọala ọkụ na ihe ndị ọzọ.

Maxwell Ogwudire bụ onye isi ndị ntorobịa CYON nke ụka Katọliki rịọrọ Peter Mbah mgbaghara n'ihi na dịka o siri kwuo, ndị mere ihe ahụ abụghị ndị otu ya, kama ha batara n'ike kpawa ọgbaaghara.

Gịnị mere n'ugwu dị nsọ?

Ndị ntorobia na-eme ọgbaghara ahụ

Ebe foto si, Screenshot/Other

Ihe onyonyo abụọ nke BBC Igbo hụrụ anya gosiri ebe ndị ntorọbịa ekweghi ka Peter Mbah kwuo okwu n'ime ụlọụka dịka ha malitere iti 'Obi Obi Obi!' mgbe ụkọchukwu kpọpụtara ya.

Ọzọkwa gosiri ebe ndị ntorọbịa ahụ nọ na mpụta ụlọụka na-emebi ọtụtụ mmanya nke Mbah jiri gaa n'ebe ahụ.

Olu dị n'ime onyonyo ahụ na-ekwu sị "anyị achọghị mmaya gị" dịka ọ na-agwa ibe ya ndị ọzọ ha "mebisie mmanya ahụ".

O mechara pụta ihe na ndị ntorọbịa ahụ mebiri otu ụgbọala nke ụlọụka ahụ n'ọgbaghara niile mere.

Ndị ntorobia ahụ.

Ebe foto si, Screenshot/Other