Akụkọ ụgha ndị gbapụtara ihe n'oge ngagharịiwe a na-ema na Naịjirịa

Ndị na-ezu ngwa ahịa ndị mmadụ na Kano
    • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu & Fauziyya Tukur
    • Ndị mere akụkọ a, Global Disinformation Team
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ọtụtụ ozi ụgha ejupụtala na soshal midịa dịka ndị Naịjirịa na-eme ngagharịiwe maka ọchịchị ọjọọ.

Ngagharịiwe ahụ a kpọrọ #EndbadGovernanceinNigeria na-aga n'ihu n'ọtụtụ obodo n'otu mgbe bụ nke a haziri na soshal midịa dịka ndị Naịjirịa pụtara n'igwe igosipụta iwe ha maka ọnụahịa ihe oriri na mmanụ ụgbọelu rịrị elu.

Ha bụ ozi ụgha bụ nke sitere n'aka ndị na-akwado na ndị na-emegide ngagharịiwe ahụ.

E sere foto ndị a n'afọ 2011?

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Onye na-azọ ikikere nke mmadụ ma bụrụkwa onye zọrọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa bụ Omoyele Sowore bipụtara ozi n'ọbaozi X ya ma na-ebo gọọmenti Naịjirịa ebubo "ibochi ndị Naịjirịa ọnụ ka ha rubeisi". O kwuru na foto ndị na-eme ngagharịiwe e bipụtara n'ịntaneetị bụ foto ochie.

O tinyere foto o setere n'akara ọbaozi Facebook nke ọ sịrị ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kano steeti bipụtara n'afọ 2011. Ozi ahụ gosiri onyonyoo ndị na-ezu ohi.

Maka BBC Global Disinformation Team chọpụtara na ihe Sowore bipụtara bụ ụgha ebe ihe onyonyoo ndị uweojii bipụtara sitere na ngagharịiwe a na-eme ugbua.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kano steeti bụ Abdullahi Haruna Kiyawa bipụtara ọtụtụ ihe onyonyoo ndị ohi a nwụchiri n'ụbọchị mbụ e mere ngagharịiwe na Kano n'akara ọbaozi nke onwe ya mmadụ narị puku abụọ na iri asaa na ise (275,000) na-eso.

Ozi ahụ Sowore bipụtara kwuru na foto ndị ahụ abụghị ndị ọhụrụ n'ihi na e bipụtara ha n'afọ 2011.

E nweghị ụdị ozi dị etu ahụ Kiyawa bipụtara n'afọ 2011.

Nnyocha BBC Global Disinformation Team mere chọpụtara na ngwongwo ndị ahụ e zuru n'ohi na foto onye ntaakụkọ BBC setere n'oge ngagharịiwe e mere na Kano dabara.

Foto onye ntaakụkọ BBC sere n'oge ngagharịiwe na Kano
Nkọwa foto, Foto onye ntaakụkọ BBC sere n'oge ngagharịiwe na Kano

Ọzọkwa, a hụrụ Kiyawa na ụfọdụ ndị ohi a na-enyo enyo n'ime otu foto ndị ahụ Sowore bipụtara. Mana ọ malitere ọrụ dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'afọ 2019 nke gosiri na foto ndị ahụ nwereike o siteghi n'afọ 2011.

Nchịkọta foto Maazị Kiyawa kesara

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Nchịkọta foto Maazị Kiyawa kesara

Uwe njirimara ndị uweojii Kiyawa na ndị uweojii ndị ọzọ yi na foto ahụ bụ nke e nyere ndị uweojii n'afọ 2012.

E nweghị etu ọ ga-esi yiri ya n'afọ 2011 nke gara n'ihu gosi na ozi Sowore bipụtara abụghị eziokwu.

Ndị uweojii Kano bipụtakwara ozi iji kọwaa na ihe Sowore kwuru abụghị eziokwu.

Ozi ahụ sịrị "foto na-egosi ndị a na-enyo enyo na ngwongwo ndị ha zuru na ngagharịiwe nke ọnwa Ọgọst 2024 na-aga n'ihu, e nweghị ihe jikọrọ ya na ihe ọbụla mere n'afọ 2011."

Kiyawa na ndị a na-enyo enyo zuru ngwa ọrụ

Ebe foto si, Kiyawa

Nkọwa foto, Kiyawa na ndị a na-enyo enyo zuru ngwa ọrụ
Skip Facebook post
Hapụ Facebook ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Facebook post

Peter Obi ihazi maọbụ kwadoo ngagharịiwe

Ozi ụgha ọzọ a hụtara na soshal midịa boro onye jiiri aha Labour Party zọọ ọkwa Onyeisiala bụ Peter Obi ebubo ịkwado ngagharịiwe.

BBC Global Disinformation Team enweghị ike chọta ihe akaebe gosiri na Peter Obi kwadoro ngagharịiwe.

E bipụtara ihe onyonyoo gosiri ebe Peter Obi na Sịnetọ Ireti Kingibe na-agwa igwe mmadụ okwu na soshal midịa ma depụta na ha abụọ na-akpọpụta ma na-enyekwa ndị na-eme ngagharịiwe ihe oriri.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Peter Obi na Sịnetọ Kingibe agọpụla onwe ha n'ebubo ịhazi ngagharịiwe.

E nweghịkwa ihe akaebe foto na-egosi na onye omeiwu ahụ nyere ndị na-eme ngagharịiwe ihe oriri.

N'ozi ọ bipụtara n'akara ọbaozi X, Sịnetọ Kingibe kwuru na ihe onyonyoo ahụ bụ oge ha na otu ndị ọrụ nwere nzukọ izuụka ndị gara aga oge ndị otu ahụ wụchiri n'isi ụlọọrụ Labour Party dị n'Abụja.

BBC chọtara ihe onyonyoo ahụ ụlọmgbasaozi dị iche iche wepụtara n'abalị 25 Julaị 2024 iji kwadoo ihe Kingibe kwuru.

E sere ihe onyonyoo ahụ n'isi ụlọọrụ Labour Party dị n'Abụja oge ha na ndị ndu Nigerian Labour Congress nwere nzukọ.

N'ọzọ yiri nke a, a gwara onyonyoo Peter Obi abụọ aka ma gosipụta ya n'ụdị na ọ na-akpọ oku maka ngagharịiwe. Onye fesara ihe onyonyoo ahụ bụ Reno Omokri bụbu onye enyemaka pụrụiche nke onye bụbu onyeisiala Goddluck Jonathan.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Ọ bụ eziokwu na Peter Obi kwupụtara ikikere ụmụafọ Naịjirịa nwere ime ngagharịiwe mana enweghị ihe akaebe gosiri na ọ kpọrọ oku maka ngagharịiwe maọbụ kwadoo ya.

Etu osiladị, ụfọdụ ndị nkwado ya a ma ama bụ ndị na-ahazi ma na-akwadokwa ngagharịiwe #EndbadGovernance.

N'otu ozi o bipụtara n'akara ọbaozi X ya, Peter Obi kwuru na ya na-akpọ oku ka e buo agha megide "ajọ ọnọdụ akụnaụba, enweghị nchekwa na nrụrụaka" oge ọ na-ekwu okwu n'Anambra steeti.