Gịnị mere ndị Naịjirịa ji chọrọ ime ngagharịiwe na-agbanyeghi nwụchi a na-anwụchi ha?

Ndị na-eme ngagharịiwe megide gọọmentị n'Ikeja, Lagọs na Juun 12, 2024. (Photo by Adekunle Ajayi)

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Naịjirịa chọrọ ime ngagharịiwe megide ihe isiike nakwa mbuli ọnụahịa kachasị ibe kamgbe ọtụtụ afọ
    • Onye dere ya, Yusuf Akinpelu
    • Ndị mere akụkọ a, West Africa Journalist
    • Ebeg o si, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Khalid Aminu nọ na-akwado ịga gbasaa ozi na Redio na Kaduna mgbe ndị uweojii nzuzo atọ yi uwe nkịtị bịara n'ụlọ ndina ya ma kpọrọ ya maka ịgba ya ajụjụ.

O kwuru na ha jichiri ya ruo ihe ruru awa isii ma jụọ ya ajụjụ maka ọgbakọ ọ na-akwa ma na-agbasaozi maka nkwado ngagharịiwe n'ụbọchị mbụ ọnwa Ọgọst

Ọ bụ site n'enyemaka onye ọkaiwu ya mere e jiri tọhapụ ya.

"Aga m eso mee ngagharịiwe ahụ na-agbanyeghi," ka ọ gwara BBC.

Dịka ya, onye ọzọ bi na Kano na-eme ihe nkiri na TikTok bụ Junaidu Abdullahi (Abusalma) nọrọ n'aka ndị nchekwa awa isii ebe ha mere ka o wepụ ihe onyonyo o tinyere ebe ọ na-akpọ oku ka e mee ngagharịiwe. A tọhapụrụ ya dịka e nyere ya ndụmọdụ na ịdọaka na ntị dịka ọkaiwu ya si kwuo.

"Ịnwụchi ndị na-ekwupụta okwu ekwesịghị ịbụ mkpa nye gọọmentị Naịjirịa ugbua ọtụtụ nde mmadụ na-agabiga oke agụụ, enweghi ezi nri oriri na ụbịam ọnụ ntụ," ka otu Amnesty International kwuru maka nwuchi ya.

Onye na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ Aminu na-akpọ oku ka e mee ngagharịiwe a kpọro “End Bad Governance in Nigeria” na-asị gọọmentị ka ha nye ohere agụmaakwụkwọ n'efu, gboo nsogbu nchekwa, tinye ọnọdụ gbata gbata na mbuli ọnụahịa ma kwupụta ego ole a na-akwụ ndị omeiwu na ihe ndị ọzọ.

Onyeisiala Bola Tinubu agwala ndị ntoroọbịa ka ha esola na ngagharịiwe ahụ, kwuo na ọ bụ ọrụ aka ndị "oso chi egbu" chọrọ iji ọnọdụ akụnaụba emebi obodo.

Ọchịchị malitere na-enweghi ezi nkwado na-ahụghị naanị na o nwetere vootu pasentị 37% iji merie na ntuliaka afọ 2023, nke kachasị nta onyeisiala na-enwete kamgbe Naịjirịa malitere.

Khalid Aminu ka o yi uwe e ji maara omenala na okpu ya

Ebe foto si, Khalid Aminu

Nkọwa foto, Aminu Khalid kwuru na ọ na-eme ngagharịiwe iji wete mgbanwe
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ ka na-achọ ka o rite mkpụrụobi ndị mmadụ tupu o kwupụta mkpebi ya iwe ego enyemaka mmanụ ụgbọala na ọkụ latrika a kpọrọ "subsidy".

Nke a, tinyere ibudata ikike ego naịra nwere n'ebe dọla nọ ugboro abụọ n'otu afọ mere ọnụahịa ngwa nri na ego ime njem jiri rịa elu orji.

Tinubu kwuru na mgbanwe ndị a bụ iji dọbata ndị achụmnta ego si ofesi ma mee ka akụnaụba kwụrụ chịm n'oge na-adịghị anya. Mana nke a amịkpọọla akpaego ndị ogbenye ma tinye ọtụtụ nde mmadụ n'ụbịam ọnụ ntụ.

Ọnọdụ enweghi ezi nchekwa, ọkachasị na mpaghara Ugwu bụ ebe a na-akọ ugbo ebe o buru ibu emeela ka ndị ọrụ ugbo si n'ọrụ gbaa ọsọ nke so mee ka ọnụahịa ngwa nrị dị elu.

Ọnụahịa ngwa nrị dịka osikapa, bins, tomato, ji na potato ji pasentị 250% rịa elu n'agbata ọnwa Mee 2023 ruo Juun 2023, dịka ụlọọrụ ngụkọ nke Naịjirịa si kwuo. Nke a kpaliri iwe ndị mmadụ.

Ọ rịọla ka e nyekwuo ya ohere iji mee ka ọnọdụ ndị mmadụ gbanwee ma tinyeaka n'akwụkwọ ka e bulie ụgwọ opekatamkpe ruo N70,000 ($44), bụ nke a na-eche ka o mee ya ka iwu dịka ndị omeiwu kwadochara ya. Ndị omeiwu nta ji ọkara gbubie ụgwọ ọnwa ha ruo ọnwa isii.

Gọọmentị Naịjirịa ekwuola ka e kesaa ọtụtụ akpa osikapa nye ndị mmadụ ma malite atụmatụ ibinye ụmụakwụkwọ ego maka agụmaakwụkwọ, wepụ ụtụisi n'ụfọdụ ngwa ahịa a na-ebubata ma rụọ ụlọọrụ ebe a na-emepụta ụgbọala na-eji mmadụ gaasị arụ ọrụ iji nyeaka maka mwepu 'subsidy'.

Tomato, ose na yabasị a kpọsara akpọsa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọnụahịa ngwa ji ihe karịrị ugboro abụọ rịa elu n'ime otu afọ

Mana, mbuli ọnụahịa ruru pasentị 34% n'ọnwa Juun bụ nke kachasị kamgbe afọ 28 mere ka ụfọdụ ndị Naịjirịa kwuo na ihe ndị a ezughi iji gboo nsogbu akụnụba siri ike.

Ha kwuru na ndị ndọrọ ndọro ọchịchị anaghị ata ụdịrị ahụhụ a ndị mmadụ na-ata. Ha chọro ka gọọmentị belata ego ole a na-akwụ ndị omeiwu ma bulie ego a na-akwụ ndị ọrụ Bekee, wepụ mbuli ego ndị ọrụ gọomentị, ụgbọelu a chọro izụrụ ha ma nke a sị otu n'ime ha bụ nke onyeisiala.

E nwekwara uche na onwghi ezi ihe gọọmentị merela iji gbochie nrụrụaka. Na nkwụsị n'ọrụ a kwụsịrị minista ya na-ahụ maka ibuso ụbịam agha n'ihi ibupu ego mana o nyeghi aka n'okwu ahụ.

Aminu gwara BBC na o na-akpọtọ ndị mmadụ na soshal midia nakwa n'ihu n'ihu dịka a na-akwado ngagharịiwe a ka ndị mmadụ kwupụta okwu megide "ọchịchị ọjọọ. Onye ọbụla na-ahụ ụfụ ya."

Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na ụjọ dị ha na ngagharịiwe a nwereike ibute ọgbaghara.

Onyeisi ndịuwojii dọrọ aka na ntị megide ngagharịiwe chọro ịdị ka nke ndị Kenya, ma kwuo na ọ dị ka ha na-eso nzọmụkwụ ndị Kenya bụ ndị na-akpọ oku ka onyeisiala ha bụ William Ruto gbaa arụkwaghịm, nke mere e jiri gbanwee iwu ụtụisi ma chụọ ndịisi gọọmentị n'ọrụ.

"Ụfọdụ ndị mmadụ na ha agbakọ na-akpọ oku ka e mee ngagharịiwe iji yie ndị mmadụ egwu n'obodo n'iji ṅomie ihe mere na Kenya," ka Egbetokun kwuru.

Ngagharịiwe e mere na Naịjirịa bụ n'afọ anọ gara aga megide ndị uweojii maka ebubo ikpu ndị mmadụ n'ụzọ na-ezighi ezi.

Ngagharịiwe EndSars mịtara mkpụrụ site na mkposa e kposara ngalaba uweojii mana ọgbaghara dapụtara bụ nke e gburu ọtụtụ ndị na-eme ngagharịiwe.

President Bola Tinubu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tinubu kwuru na o meela ngaharịiwe mbụ mana ọ bụ n'ụzọ udo

Ka ọ dị ugbua, atụmatụ ngagharịwe a enwebeghi onye a ga-asị bụ onyendu, a na-eche na ọ dị etu a ka a ghara inwụchi ya maọbụ si n'azụ nwee mkparịtaụka.

Mana Aminu kwuru dị a na-enweghi onyendu, na e nwere ndị nchịkọta.

"E nwere nhazi ndị na-aga n'ihu ugbua iji mebie ihe anyị na-achọ ime," ka o kwuru. "Ọ bụrụ ya mere o ji dị mkpa na ndị Naịjirịa nwere ezi uche ga-apụta ka a chịkọta ihe ọnụ."

Omoyele Sowore, zọburu ọkwa onyeisiala nọ n'akụkụ nke ya na-akpọ oku ka maka ngagharịiwe a, ọ kpọro ya "ụbọchị iwe", na-ekesa akwụkwọ n'ịntanetị banyere ya.

Ụfọdụ ndị ọrụ onyeisiala boro ndị ndọrọ ndọro na-ama ha aka dịka Sowore na onye ji aha Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala bụ Peter Obi ebubo na ọ bụ ha na-akpali iwe ọha ma na-akwado ngagharịiwe a, mana Labour Patị agọnarịla ebubo ahụ.

Mịnịsta mgbasaozi bụ Mohammed Idris anwaala imedata obi ndị mmadụ ma sị na ndị na-achọ ime ngagharịwe "bụ ụmụnne anyị ndị nwoke na nwaanyị".

"Ihe a bụ nsogbu metụtara ezinaụlọ ndị Naịjirịa, anyị niile na-eleba anya na nsogbu, anyị nwe olileanya na udo ga-achị n'ikpeazụ," ka o kwuru.

Ngagharịwe ndị e mburu dịka EndSars banyere ọgbaghara site na nsọkọta isi ndị ọrụ nchekwa na ndị na-eme ngagharịiwe.

Echiche ihe mere na EndSars dị ire dịka a na-akwado ngagharịiwe n'ụbọchị mbụ ọnwa Ọgọst. E nwere ndị na-agaghị esonye n'ihi ihe mere na EndSars n'afọ 2020. E nwekwara ndị ọzọ dịka otu na-ahụ maka ụmụakwụkwọ na Naịjirịa (NANS) kwuru na ha agaghị esonye na ngagharịiwe a.

Tinubu kwuru na o duru ndị mere ngagharịiwe megide gọọmentị - mana ọ bụ n'ụzọ udo.

N'izuụka ọzọ, a ga-anwale ihe o ji biri n'ụzọ ọchịchị onye kwuo uche ya bụkwanụ nke o ji eto ọnụ, ọ bụghị naanị dịka onyeisiala Naịjirịa kama dịka onyeisioche otu Ecowas.