Ihe ndị na-akwado ime ngagharịiwe chọrọ n'aka gọọmenti

Ndi na-eme ngagharị iwe
Nkọwa foto, Ndi na-eme ngagharị iwe
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ọnọdụ obibi na-akwanye njọ

Ihe bụ isi sekpu ntị n'ọkụ ngagharịiwe a na-akpọ bụ akụnụba obodo Naijiria na-etikpọ etikpọ.

Kemgbe Onyeisiala Bola Tinubu wepụrụ ego "Subsidy" mmanụ agbịdị n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee afọ 2023 ọnụ ahịa ihe niile jisike arị elu.

Ndị mmadụ na-agbarụ ihu na ego ihe niile arịala elu nke mere na ha enweghị ike azụ kama nri nkịtị. Ụfọdụ ekwukwala na ha enweghị ike eri nri kama otu mgbe n'ụbọchị.

Ngụkọ nke ụlọọrụ ndekọ bụ NBS n'ichafu wepụtara gosiri na otanisi eruola pasent ị 34.9 n'onwa Juun afọ a ebe otanisi kacha metụta bụ nri.

Otanisi nri nozi na pasentị 40.87 karịa pasentị 15.6 ọ dịbu n'ọnwa Juun afọ 2023.

Ihe ọzọ bụ na ọnụ mmanụ ụgbọala arịala elu ugboro anọ kemgbe afọ gara aga nke mere na ọnụ ahịa njem nakwa ngwa ndị ọzọ a na-ebugharị soro ya rịa elu.

Ọnọdụ nchekwa ọjọọ

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọnọdụ nchekwa ọjọọ bụ ihe ọzọ na-echu ndị mmadụ ụra na Naijiria.

Otu ụlọọrụ na-edekọ ihe banyere nchekwa na Naịjirịa kwuru na mmadụ 5, 710 nwuru na onwa isii mbụ n'afọ a bụ nke kachasị kemgbe afọ 2013.

Onyeisi Tinubu na ndị isi ọrụ nchekwa ezutela onwe ha kwa mgbe kwa mgbe iji wepụta atụmatụ ga-ahụ na nchekwa dị mma.

Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ zutekwara onwe ha n'izuụka ole ma ole gara aga iji kpaa maka nsogbu nchekwa na mpaghara ahụ.

N'agbanyeghị nke a, ntọrị ka na-arị elu ọ kachasị na mpaghara ugwu.

Ọnọdụ ahụike nakwa ọnụ ahịa ọgwụ

Otu nwata nwaanyị gwara BBC na ọ na-ahọrọ n'etiti iri nri nakwa ịzụta ọgwụ dị mkpa na-azo ya ndụ n'ihi ọnụ ahịa ọgwụ na ebe ọ kwụzi ugbua.

Ọ sị na kemgbe ọnụ ahịa ọgwụ o ji agwọ ọrịa Asthma riri elu, ọ na-ahazi onwe ya ofụma tupu ọ zụta ya.

Onye ọzọ gwakwara BBC na ọ kwụsịla ịzụ ọgwụ Bekee ma jirizia mgbọrọgwụ agwọ onwe ya.

"Anaghị m aṅụzi mmiri oyi maka na o so n'ihe ndị na-akpalite ọrịa m, n'agbanyeghị na mkpomọkụ dị" ka o kwuru.

Ihe mere ụfọdụ ndị ntoroọbịa ji gbaa isi akwara na ha ga-eme ngagharịiwe

Onye na-eme ngaghariiwe

Ebe foto si, Getty Images

Kemgbe izu olemaole gara aga ka ndị ntorobịa Naijiria na-ekwu na ha ga-eme ngagharịiwe iji gosi iwe ha maka ọnọdụ obibi ọjọọ dị na Naijiria ugbua.

Ha na-eme nke a n'agbanyeghị oku ọtụtụ otu na-akpọ ha emena ya.

Ngagharịiwe ahụ nke e ji #EndBadgovernanceinNigeria mara bụ nke e kwuru ga-amalite site n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọọst na-abịa na-ebute nkewa n'etiti Naijiria niile dịka ụfọdụ ndị na-akwado ya ebe ndị ọzọ na-akatọ ya.

Nke a na-abịa dịka gọọmenti mba Bangladesh na ụmụ akwụkwọ na-achịpu ya maka ngagharịiwe ha na-eme dịka ihe ruru mmadụ 150 nwụrụ na ya bụ ihe.

N'otu aka ahụ gọọmenti mba Kenya ji nwayọọ e so ngagharịiwe nke ndị ntorobịa mba ha dịka mmadụ ruru iri nwụrụ mgbe ndị nchekwa ji aka ike chụsaa ndị gbakọrọ maka ya bụ ihe.

Lee ihe BBC chọpụtara mere ka akwado ihibe ya mbụ.

Nwaanyi so eme nzogbu nzogbu
Ahia na nri

Ebe foto si, Getty Images

Ihe gọọmenti kwuru

Onyeisiala Tinubu

Ebe foto si, Asiwaju Bola Tinubu/Facebook

Kemgbe akụkọ banyere ngagharịiwe ji malite, ụfọdụ ndị mmadụ etinyela ọnụ na ya.

Ndị ụlọomeiwu kpebiri n'izu gara aga na ha ga-enyefu ụgwọ ọnwa ha ruo ọnwa isii iji kwado mgbọ gọọmenti na-agba maka ọdịmma Naijiria.

N'otu aka ahụ ha akụkọ kwuru na ha akpọọla oku ka a tụgharịa ọnụ ahịa ụgwọ latrik ebuliri.

Gọọmentị n'onwe ha kesara gwongworo kwuru gwongworo bu osikapa na steeti niile dị na Naijiria iji belata agụụ.

Onyeisiala Bola Tinubu arịọkwala ndị ntorobịa ha mịa mma n'ọbọ ma nwere ya ndidi ịhụ na ihe tụgharịrị na Naijiria.

Kedụ ndị chọrọ ihibe ya bụ ngagharịiwe?

Dịka ihe si kwụrụ e nwebeghi otu pụtara kwuo na ọ bụ ha hibere ya bụ ngagharịiwe.

Kama na otu ihe doro anya bụ na ndị ntorobịa na-ekwusi ike maka ya bụ ngagharịiwe na-akpọ onwe ha oku pụta sonye n'ụbọchị ahụ.