"Onye Igbo ọbụla esonyekwala na ngagharị iwe ọbụla" - Ohaneze

Ohaneze

Otu ndị Igbo n'ụwa niile bụ Ohaneze Ndịgbo adọọla ndị niile si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ka ha ghara isonye na ngagharịiwe ọbụla a na-eme na Naịjirịa.

Nke a dị n'akwụkwọ mgbasaozi nke onyeisi Ọhaneze bụ Emmanuel Iwuanyanwu binyere aka ma bipụa ụbọchị Mọnde.

Na mgbasaozi ahụ, o kwuru na ya enwetala ọtụtụ ozi si na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa na ndị na-akpọ ya oku dị icheiche ka ọ gwa ndị igbo ka ha sonye na ngagharịiwe a na-eme megide ndị isi ọchịchị mana n'okwu ya; "dịka onye ndu unu, ana m ekwu ka ọ ghara inwe otu Igbo ọbụla na Naịjirịa maọbụ n'ofesi ga-esonye ngagharịiwe ndị a".

Ọ gara n'ihu kwuo na ya ka na-enyocha ọnọdụ ihe na-eme mana ya na-ajụ ndị na-agwa a ka ndị Igbo sonye ajụjụ ; "gịnị ka ha mere oge ndị ọchịchị gara aga napụrụ ndị ala Igbo ikike itu vootu?

Ihe Iwuanyanwu na-enyocha

Iwuanyanwu

Ebe foto si, CHANNELS

Dịka mgbasaozi ahụ Iwuanyanwu bipụtara siri kwuo, o depụtara ụfọdụ ihe gbara ọkpụrụkpụ bụ ihe ndị ọ na-enyocha. Ụfọdụ n'ime ha bụ;

  • Ọtụtụ ndị bụ ndị Igbo bi na mpaghara Owuwa Anyanwụ mana a na-akpa oke megide ndị ọwụwa anyanwụ nke na-agba anya mmiri. N'okwu ya; "naanị mpaghara anyị bụ mpaghara nwere naanị steeti ise nke na-efularị ijeri kwuru ijeri ego. O fukwala anyị ọtụtụ ihe na nhọpụta na nnọchiteanya n'ụlọomeiwu ndọrọndọrọ.

Iwuanyanwụ kwuru na ekwela nkwa ikewapụa steeti na mpaghara ọwụwanyanwụ ọtụtụ oge mana ruo taa, o nwebeghi ihe e mere. N'okwu ya, "werenụ ozi a ka ozi ikpeazụ m ga-eji kwuo maka ikewapụa steeti n'ọwụwa anyanwụ, ma e meghi ya, aga m aga ụlọikpe".

2. 'E jirila atụmatụ 'federal character' rụpụ ndị Igbo n'ọchịchị'. Nke a bụ dịka Iwuanyanwu siri kwuo. O kwuru na agbanyeghi na ndị Igbo gara ịchọ ka onye ọbụla gbaa mbọ gosi ike ya ma sonye n'ọchịchị, ha chọpụtara na Naịjirịa nwere ọtụtụ agbụrụ na asụsụ dị icheiche mere ha jiri kwenye n'atụmatụ 'federal character'. N'okwu ya 'iji maa atụ, onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru hohaa n'ọha na ya enyeghi anyị ihe ruru anyị maka na anyị atụnyereghi ya vootu".

3. Nnwuchi na mkpọchi Maazị Nnamdi Kanu nke o kwuru na ọtụtụ ndị Igbo etinyela ọnụ ka a tọghapụ ya.

4. N'ozi ya, ihe nke anọ bụ "mmegbu na mkpagbu a na-akpagbu ndị Igbo maka na ndị APC emerighi ntuliaka na Legọs nakwa n'Abuja bụ nke e jiri chọọ ime ka ekpenta daa azụmahịa ndị Igbo na Legọs, Abuja na mpaghara ndị ọzọ.

Kedụ ihe ọ chọrọ ka ndị Igbo mee?

Iwuanyanwu kwuru ka ndị Igbo kwado onyeisial Bola Tinubu n'ihi na ụlọikpe kachasị ekpebiela na ọ bụ onyeisiala Naịjirịa ma bụrụ onye meriri ntuliaka afọ 2023. N'okwu ya; "o nweghi ihe anyị nwere megide ya, oge ọ bụ gọvanọ na Legọs, o mere ndị Igbo nke ọma, ya mere na anyị ga-akwado ya mana ya nyeghachikwa anyị nkwado ahụ ma nye anyị ihe ruru anyị dịka ndị Naịjirịa. Anyị anaghị achọ nke onye ọzọ." Iwuanyanwu kwuru.

'Chọpụta ihe mere ndị Igbo ji nọrọ nwayọọ' - Usman Yusuf

Usman Yusuf

Ozi ndị Ohaneze na-abịa dịka mpaghara dị iche iche na Naijiria na-ede jiji n’ihi mgbalị ọnụahịa nri na ihe ndị ọzọ.

Onye bụbụ odeakwụkwọ ukwu na-ahụ maka ụlọọrụ ‘National Health Insurance Scheme (NHIS) bụ Ọkammụta Usman Yusuf kwuru na jụụ ndị Ọwụwa-Anyanwụ deere n’ihe nile na-akpọtụ dị ime, ma dụọ onyeisiala Bola Tinubu ọdụ ka ọ chọpụta ihe kpatara ya.

Yusuf, onye rụtụrụ aka na ndị eze ọdịnala ndị Ugwu na Ọdịda-Anyanwụ nakwa ndị ụkọchukwu ụka alakụba etiela mkpu bekuo Tinubu ka ọ mara ihe e mere ya bụ ihe mana ndị Ọwụwa Anyanwụ gbara nkịtị.

O kwuru ka onyeisiala Tinubu nyochaa ihe mere ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ jiri gba nkịtị.