Same-Sex Blessing: Anyị na Pope akwụghị - Ndị Bishopu Katọlik

Ebe foto si, Nigeria Catholic Network/Facebook
Bishopu ndị ụka Katọlik na Naịjirịa ekwuola hoo haa na ha na Popu akwụghị n'otu ebe gbasara inye ndị otu okike ngozi.
Ha kọwara na nke a bụ maka ha sị na okwu ahụ Pope bụ onyeisi ụlọụka Katọlik kwuru bu igosi nkwado n'ebe mmekọ ndị otu okike nọ.
Onyeisi ọgbakọ ndị Bishopụ ahụ bụ Lucius Iwejuru Ugorji n'Abuja kwuru na ihe ọbụla si na Holy See pụta kwesiri ijikọ na ikwado ụlọụka Katọlik kama na ọ bụ ihe mwute na Fiducia Suplicans merụrụ njikọ ụlọụka ahụ ahụ.
"Anyị ga-ekwu eziokwu hoo haa na Mkpebi Fiducia Supplicans (Nkọwa ihe ngozi ụkọchukwu bụ) nke pụtara n'ụbọchị 18 nke ọnwa Disemba etinyesola n'ihe mgbu anyị" ka Ugoriji kwuru.
Ọ gara ihu kwuo na n'agbanyeghi na ya bụ akwụkwọ machiri ngozi nke liturgy maka ndị na-ayị otu okike ha, o nyere ohere ka agọzie ndị na-ayị onwe ha nke gụnyere ndị na-ayị otu okike ha.
"Mkpebi nke Pope wepụtara butere ọgbaghara n'etiti ndị ụka Katọlịk na-anwa ịghọta etu a ga-esi gọzi ndị n'ebi ndụ n'ime mmehie.
N'ime ọgbaghara na nghọtahie na-efegharị, ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ịchekwa okwukwe idebe nsọ, ịkwụwa aka ọtọ so na nkuzi nke ụka site n'akwụkwọ nsọ na omenala.
Kedụ ebe okwu si bido?

Ebe foto si, EPA
Popu Francis kwuru ka ndi Fada na-enye umunwoke na-alụ nwoke ibe ha ngozi na nzụkọ Katọlik.
Nke a butere iwe n'etiti ọtụtụ ndị mmadụ ọ kachasị ndị ụlọụka Katọlik kwuru na Pope na-emebi ihe ha jiri kwụrụ ebe ha kwụ.
Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis ekwuola na ndị Bishọp mba Afrịka nwere nghọta pụrụiche n’okwu ya banyere ịgọzi nwoke maọbụ nwaanyị chọrọ ịlụ ibe ya.
Mana ọ gara n’ihu nwee nkwenye siri ike na oge na-adịghị na mkpebia ụlọụka nwere banyere nke a ga-edo onye ọbụla anya.
N’ajụjụọnụ ụlọọrụ akwụkwọ ntaakụkọ Italy gbara ya, Pope kwuru na ụlọụka Afrịka na ndị nkwado ha hụtara mmadụ inwe mmasị n'ụdịdị ya dịka “ihe ọjọọ” n’ụzọ omenala.
O kwuru na ozi ọhụrụ ahụ ha wepụtara n’ọnwa gara aga a kpọrọ ‘Fiducia Supplicans’ bụ “iji nabata na-abụghị ikewa”.
Pope Francis kwuru na ọ na-aghị emetụta ya ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị si n’ụlọụka Katọlik kewapụta n’ihi nwogharị a, ma sị na ihe butere okwu niile a bụ “obere otu nwere echiche dị iche”.









