Ndị Ika ha bụ ndị Igbo ka ha bụ ndị Iduu si Bini?

Aha onyonyo, Cultural identity: Ika abụ Igbo ka ha esi Bini?
Ndị Ika ha bụ ndị Igbo ka ha bụ ndị Iduu si Bini?
Kingsley Kainebi
    • Onye dere ya, Uche Akolisa & Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist

Ụfọdụ ndị agbụrụ na-asụ Igbo na mpaghara ofe Akwammiri Naija ọkachasị Delta na Edo Steeti na-ekwu na ha abụghị ndị Igbo.

Obodo ndị bụ Ika nọ na Delta nakwa Edo steeti taa gụnyere Agbor, Umunede, Abavo, Akwụkwu,Otolokpo, Igbanke, Akuoma, Owa, Utokpu, Emuhu Akumazi, Ute-Ogbeje wgd.

Mapụ ụfọdụ obodo ndị ndị n'Ika

Na-agbanyeghị n'ụfọdụ ndị a na-aza aha Igbo ma nwekwa nkwenye,omenala na ejiji e jiga mara ndị Igbo.

Na mkparitaụka ya na BBC Igbo nwere, otu nwa afọ mpaghara ahụ ma bụr u onye na-agba mbọ maka njiko Igbo n'olu nakwa n'ala Igbo bụ Kingsley Kainebi kwuru na ọ bụ Agha Biafra butere nke a.

Naijiria na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ochie lụrụ agha a kpọrọ 'Agha Biafra' afọ atọ malite n'afọ 1967 rue afọ 1970 dịka ndị Ọwa Anyanwụ chọrọ ikewapụ na Naijiria.

Naijiria meriri n'agha ahụ.

N'afọ 1967, Gọọmentị Etiti n'oge ọchịchị Yakubu Gọwon keriri mpaghara anọ dị na Naijiria mee ya steeti 12 nke metụtara mpaghara nile dịbu n'Owuwa Anyanwụ Ochie.

Na nkọwa ya, Kainebi kwuru na Igbo nile bụ otu ebe ọbụla nile ha nọ.

O kwuru na ọ bụ asụsụ,nzakọ aha, omenala na ọdịnala so n'ihe eji ama ndị bụ nwanne.

Kirie ihe o kwuru n'uju: