Ọmụ Anioma: Ihe niile ị kwesiri ị ma maka igwe nwaanyị lara mmụọ

Omu nke Anioma

Ezenwaanyị Obi Martha Onyemachi Dunkwu bụ Ọmụ Okpanam alakwurula chi ya.

Ọ n'ọkwa pụrụiche n'Ọkpanam malitere afọ narị asaa gara aga bụ nke na-elekọta ụmụnwaanyị ma bụrụkwa onye ji ọfọ agbara ha tupu ọnwụọ.

Mgbe ya na BBC nwere mkparịtaụka, ọ kọwara etu osiri rigoro n'ọkwa ọmụ.

Ọ kwuru na ọ bụ alabekee ka osi lọta wee chie ọmu.

N'nkọwa ya, mgbe osi alabekee lọta, ihe o bu n'obi bụ ị bụ onye ndoro ndoro ọchịchị mana mana osighị etu ahụ mee n'ndụ ya.

Ezenwaanyị Dunkwu nwụrụ na Fraide ka ọ rịachara obere ahụ, dịka ozi zi eznaụlọ ya si kwuo.

Ọmụ Martha Dunkwu bụ nwaanyị e nyere ọkwa Eze n'obodo Okpanam dị na Delta steeti.

Ọ bụ onye na-egosipụta omenala ndị obodo ya na ndị Igbo si mpaghara ahụ a kpọrọ Anioma n'ụzọ pụrụ iche.

Ọnụ na-ekwuru ya bụ Patrick Ochie si gwa BBC Igbo n'ekwentị, sị, "Ọmụ alaala."

"Abalị abụọ gara aga ka ha bụ bidoro rịawa ahụ."

A kpọọ dọkịta, ọ bịa leta ya n'ụlọ ma sị ka e buga ya ụlọọgwụ."

O rue ụnyahụ ọ kawanye njọ."

"O rue taa(fraide) ọ nwụọ."

Akụkọ na-abịa.

Ihe ndị ị maghị maka Ọmụ

Ọmụ Martha Dunkwu

Ebe foto si, Dunkwu Family

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

A mụrụ Martha Dunkwu n' Okpanam dị n'Okpuru ọchịchị Oshimili North na Delta steeti.

Ọ gara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ St. Joseph’s Catholic School, Barkin Ladi, Platu steeti nakwa St. Murumba’s College, Okpanam, Delta Steeti.

Ọ rụrụ ọrụ Bekee na Mịnịstrị na-ahụ maka ego nke ochie Bendel Steeti(Edo na Delta) tupu ọ gawa mba ofesi maka ịgụkwu akwụkwọ.

Ọ gụrụ na 'L.T.C. College of English and Secretarial Studies', dị na London nakwa 'South West London College', Ingland.

O mechara gaa gụọ na mahadum ' University of Nevada, dị na mba Amerịka.

E chiri ya 'Ọmụ nke Ọkpanam' nke bụ ọkwa Eze e nyere nwaanyị dịka onye ndu obodo n'abalị 26 nke ọnwa Jenụwarị afọ, 2002.

E mechara chie ya "Omu Anioma' n'abalị 15 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2010.

Igwe Nsukka Nkpunano dị n' Enugu Steeti chiri ya echichi 'Nne Ọha ' n'afọ 2020.

E ji ịgbasa oziọma banyere omenala Igbo nakwa ikike dịịrị ụmụnwaanyị mara .

A makwa ya dịka onye mere ka ọkwa 'Ọmụ nakwa omenala ndị Anioma pụta ihe n'ụzọ pụrụ iche.