Cost of living: Lee ụfọdụ ụzọ ndị mmadụ si ebighari ndụ ugbua maka ihe isi ike na Naịjirịa

Igbo tụrụ ilu sị na "anụ mụta ka e si agba ajọọ ọsọ, dinta amụtakwa ka e si agba ya ajọọ egbe".
Etu a ka imi na anya dị n'ebe ọtụtụ ezinaụlọ nakwa ndị mmadụ bi na Naịjirịa ugbua dịka ihe isi ike n'anyụ ọtụtụ ịkpakwụ.
N'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee educhara onyeisiala Naijiria bụ Bola Tinubu n'iyi ọrụ ka o nyere iwu ka ewepu ego nkwado mmanụ agbịdị bụ "Subsidy" na Bekee.
Kemgbe ahụ, ọnụ ahịa nri nakwa ọnọdụ obibi ndị mmadụ na Naijiria na-akawanye njọ.
Iji ma-atu, otu akpa akwa ọkụkọ bụbu puku naira otu na ụma n'ọnwa Mee ahụ bụzi puku naira anọ.
O nwere akụkọ pụtara banyere etu ndị mmadụ si erizi osikapa mkpofu n'ihi ụkọ nri na agụụ.

Ebe foto si, Getty Images
Mgbanwe ọhụrụ n'obibi ndụ

Ebe foto si, Getty Images
Ụgbọala
O nwere ezinaụlọ a chọghị ka a kpọọ aha ha gwara BBC na ha rere ụgbọala ukwuu ha a kpọrọ 'ọkwụọtọ ekele Eze' ma zụta ụgbọala obere.
Nna ezinaụlọ ahụ kọwara na ọ bụ n'ihi ego ọ na-eri ya ịzụ mmanụ ụgbọala n'ime ụgbọ ukwu ahụ.
Njem kwa ụbọchị
Ndị ọrụ Bekee n'ụfodụ obodo ukwu dịka Legọs, Abuja na ndị ọzọ chepụtara ụzọ ha ga-esi belata ego ha na-akwụ n'ime njem ụgbọala kwa ụbọchị ị ga-ọrụ.
Ihe ndị ahụ na-eme bụ ibili n'ụzụ ụtụtụ jiri ụkwụ gaa nwa obere ụzọ na njem ha tupu ha abanyezie ụgbọala ga-ebuga ha n'ụlọọrụ.
Obibi n'ụlọ
N'agbanyeghị na oge mkpomọkụ na-akawanye njọ, ihe ụfọdụ ezinaụlọ na-emezi bụ ịgbanye igwe ọkụ latrik ha obere oge karịa ihe ọ bụbu.
Otu nwaanyị bụ oriakụ Alabi gwara BBC na nwoke onye agbataobi ya na-amụnye igwe ọkụ ya naanị site n'elekere itoolu rue etiti abalị karịa elekere asatọ ọ na-amụnye bu ya.
Nke a bụ iji belata ego a na-emefu na mmanụ ọkụ.
Nri oriri
Ọ bụ n'ihe gbasara nri ka ọtụtụ ndị mmadụ mekarichara mgbanwe n'ihi ọnụ ahịa nri jisike na-arị elu ebe ụgwọ ọnwa ọtụtụ ndị mmadụ ka kwụ ebe ọ kwụ.
Ihe ndị mmadụ mere na nri gunyere;
- Ị ri nri naanị otu ugboro kwa ụbọchị
- Ị ji anụ si nri naanị otu ụbọchị kwa izuuka. Ụfọdụ akwụsila ịta anụ, na-eri akwa maọbụ azụ ndị obere.
- Ị ri osikapa mkpofu
- Ị ji nkụ esi nri kama iji gaasi maka ọnụ ahịa gaasi esorola mmanụ ụgbọala rịa elu.









