Lee ihe iwu ga-eme igwe mmadụ jikọrọ aka tie otu onye ihe

Ebe foto si, Reuters
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Igwemmadụ ịjikota aka ọnụ tie mmadụ ihe nke ndị bekee kporo ‘Mob Action’ bụ otu ihe kpatara ọnwụ ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa.
Ndị aka ha dị ọcha awụọla maka na ọhammadụ jịkọrọ aka ọnụ tigbuo ha maka ebubo e boro ha ma-hara ijuese mata nke bụ eziokwu.
Kwa afọ, mmadụ karịrị otu narị na-anwụ na Naịjirịa n’aka igwemmadụ iwe ji. Enwekwara ndị igwemmadụ tigburu bụ ndị aka ha dị ọcha, ebe enwere ndị ejidere ebe ha na-eme mpụ ma tigbuo ha na akpụgaghị ha n’ụlọ ndị uweoji.
Ọkaịwụ ndị BBC Igbo gbara ajuju ọnụ bụ Nnenna Anozie na J.E Onyeabor kwekọrịtara na ọ bụ ihe megidere ịwụ Naịjirịa ma dọọ ndị mmadụ aka n’ntị ka ha gbanarị iso tie onye e boro ebubo ihe.
Ihe na akpata igwemmadụ iti onye e boro ebubo ihe (mob action) n'ala Igbo
Igwemmadụ ịtị mmadụ ihe abụghị ihe ọhụrụ n'ala Igbo. Mana nke omenaala Igbo akwadoghị bụ ikugbu onye ahụ e boro ebubo.
Ozokwa, e nwere ọtụtụ usoro ndị Igbo ji ata onye mere ajọ ihe ahụhụ dịka iti ihe, ịgba onye ahụ mmịrị, ida onye ahụ nha na ihe ndị ọzọ.
Ụmụada na ndị otu ọgbọ nwekwere oge ha na abịakọta ọnụ ma taa onye na-eme ajọ ihe ahụhụ.
Ihe dịka onye zulu ohi, nwaanyị gbara n’ilo, nweoke metoro nwatakiri na ajo ihe ndị ọzọ ala na asọnsọ so akpata igwemmadụ iti onye mere ya ma ọ bụ onye eboro ebubo ihe.
Mana Ọkaiwu Nnenna Anozie na J.E Onyeabor kwuru na ịwụ Naịjirịa nyere naanị ụlọikpe ikike ịta mmadụ ahụhụ ma katọọ igwemmadụ iti onye obuna ihe.
Ihe mpaghara dị icheiche n’ala Igbo na akpọ igwemmadụ iti mmadụ ihe
N’ala Igbo, e nwere aha na nkọwa dị icheiche ndị Igbo na-enye igwemmadụ iti mmadụ ihe.
Ọtụtụ kọwara ya dịka ọhammadụ imeso mmadụ iheike. Ndị ọzọ kọwakwara ya dị ka Igwe mmadụ iweji ịkụ mmadụ ihe, ebe ndị ọzọ na ahụ ya dịka ‘ụtụaka’.
Ịtụ mmadụ ụtụaka gunyere igwe mmadụ ịtị otu onye ihe, ma ọ bụ igwe mmadụ ịtị ọtụtụ mmadụ ihe.
N’Enugu, ụfọdụ ndị Agbaja, ọkachasị n’okpuruochichi Ezeagu na Udị na akpọ ya ‘iti mmadụ ajamme’.
Na mpaghara Imo steeti na Abia steeti, enwere ndị na akpọ ya igbuilu; ebe ọtụtụ ndị ịgbo ndị ọzọ na akpọkwa ya ‘Ịkpụ-ụkpụ’.
Mana ihe ọbụla a kpọrọ ya, onye mere ihe obodo kpọrọ nsọala, ndị a na enyoenyo, ma ọ bụ ndị e bọrọ ebubo bụ ndị na ata ahụhụ ya.
A na eti ọtụtụ n'ime ha ihe na-enweghị ikpe ziri ezi.
Nkọwa ọkaiwu J.E Onyeabor nyere igwemmadụ iti mmadụ ihe
Ọkaiwu J.E Onyeabor, onye bụbụ odeakwụkwọ otu jịkọrọ ndị ọkaiwu n'Enugu steeti kọwara ‘Mob Action’ dịka igwe mmadụ ịjị iwe wakpoo mmadụ maka ebubu.
Ọ kọwara nwakpo ahụ dịka nke e mere na enweghị nkwadọ ụlọikpe. N'okwu ya “Igwe mmadụ iti mmadụ ihe megidere ikike dịalụ mmadụ”.
Ọ gara n’ihu kwụọ na “Mpaghara ịrị atọ na atọ n’akwụkwọ ịwụ Naịjirịa nke afọ 1999 kwuru maka ikike mmadụ nwere ịdị-ndụ. Otụtụ oge, igwe mmadụ na akugbu onye ahụ eboro ebubo nakwa onye aka ya dị ọcha”.
“Oge igwe mmadụ ahụ na awakpo onye eboro ebubo, ha nwereike iwe ndụ onye ahụ”.
“Ọzọ bụ na mpaghara ịrị atọ na anọ n’akwụkwọ ịwụ Naịjirịa nke afọ 1999 katọrọ igwe mmadụ ịtị mmadụ ihe”.
Ntaram ahụhụ dịrị ndị jịkọrọ aka kugbuo mmadụ - Ọkaiwu Anozie
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Okaiwu Nnenna Anozie kowara na enwere ntaramahụhụ dịrị onye obula ma ọ bụ igwe mmadụ jịkọrọ aka were tie mmadụ ihe nke kpatara ọnwụ onye ahụ eboro ebubo.
Anozie kwuru na akụkụ 33, 34 nakwa 36 ịwụ Naijirịa nke afọ 1999 kọwara ikike dịịrị mmadụ ma dọọ aka na ntị na ụlọikpe nwereike ima ndị ahụ ikpe ọnwụ ma ọ buru na onye ha tiri ihe nwụọ n'aka ha.
“Ụlọikpe nwere ike ịtụ mmadụ nga maka ya maọbụ maa mmadụ ikpe ọnwụ. Ịwụ Naịjirịa kwuru na aka onye obula dị ọcha rụọ mgbe ụlọikpe mara ya ikpe”.
“Mmadụ eweghị ikike iji aka ya nye onye ọzọ ọpịpịa ma ọ bụ taa ya ahụhụ”.
“Ọ bụrụ na enweghi ụlọ ndị uweoji nọ nso, kpụpụ onye ahụ ụlọikpe ka ọ ga zara ọnụ ya”.
Anozie kwukwara na enwere ịwụ machịrị ime onye ahụ ihe ike bụ Violence against persons prohibition law VAPPL nke afọ 2025 nke dị ire na steeti niile dị na Naịjirịa.
“VAPPL deputara ntaram ahụhụ dịaalụ ndị na eme mmadụ ibe ha ihe ike.
Ntaramahụhụ ahụ gunyere ịtụ nga nakwa ịda onye ahụ nha”.









