Aka anyị adịghị na mwakpo e mere n’isi ụlọọrụ NLC - DSS

Ebe foto si, DSS/NLC
Ụlọorụ DSS ekwuola na enweghị oge ha wakporo isi ụlọorụ otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ NLC dị n’Abụja.
Akụkọ fesara ebe niile na ndị ọrụ nchekwa jiiri ike wakpoo ma banye n’isi ụlọọrụ NLC mana onyeisi ụlọọrụ DSS bụ Peter Afunanya kwuru na aka ndị ọrụ ya adịghị na mwakpo ahụ.
Cheta na otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) tiri mkpu wee kwuo na ndị ọrụ nchekwa wụchiri n’isi ụlọorụ ha dị n’Abụja mgbe o jiri ihe dịka ọkara gaa elekere asatọ nke abalị Wenezde 8 Ọgọst 2024.
Ozi si n’aka onyeisi ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze n’otu NLC bụ Benson Upah kwuru na ndị ọrụ nchekwa ahụ tikara ụzọ ebe ha na-echekwa akwụkwọ ma buru ọtụtụ akwụkwọ ndị otu ahụ.
Ozi ahụ sịrị na ha bụ ndị ọrụ nchekwa kwuru na ha na-achọ ụfọdụ akwụkwọ e jiri mee ngagharịiwe na nso nso a n’ihi agụụ na ihe isiike.
NLC kpọrọ oku ka e wezuga ndị ọrụ nchekwa n’isi ụlọorụ ha ozugbo ma kọwaa taa dịka “ụbọchị iru uju” maka ọchịchị onye kwuo uche ya nke Naịjirịa dịka ha kwuru na e nwebeghị ọchịchị ọbụla wakporo isi ụlọọrụ NLC, ọbụnadị ọchịchị ndịagha.





















