Enugu governorship tribunal: LP ekwuola na ha ga-agbagha mpụtara ikpe a

Ebe foto si, Mbah/Edeoga/Facebook
Onye ji aha otu Labour Party zọ ọkwa Gọvanọ n'Enugwu steeti ekwuola na ọ ga-ekpegharị mpụtara nke ụlọikpe nyere maka ntuliaka steeti ahụ.
Edeoga si n'aka ọnụ na-ekwuchitere ya bụ George Ugwu were wepụta ya bụ ozi.
Ozi ahụ sị "anyị chọrọ ikwu na anyị anụla maka mpụtara ụlọikpe nyere na Tribunal ma kwukwa na anyị dị njikere ịgbagha ikpe a n'ụlọikpe mkpegharị dịka iwu si nye"
O jikwa ohere ahụ rịọ ndị nkwado ya n'Enugwu nakwa na Naịjirịa niile ha wetuo obi gara mkpa ha n'atụghị ụjọ.
Etu ikpe nyere Peter Ndubuisi Mbah mmeri siri gaa

Ebe foto si, Peter Mbah/BBC
Gọvanọ Enugwu, bụ Peter Ndubuisi Mbah, enwetala mmeri taata n'Election Petition Tribunal e kpere ikpe ya n’Enugwu.
Ya bụ agba nke ikpeazụ ka akapịrị ọnụ taata n'ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka, nke Ọkaikpe Kudirat Akano nọ n’isi ya.

Justice Kudirat Akano kpebiri na ikpe Chijioke Edoga nke Labour parti achịtaghị aja ma ncha nke mere o jiri kachapụ ya, ma kwuo na ntuliaka wepụtara Peter Mbah bụ nke ọma ya.

Tribunalu ahụ kwuru na asambodo NYSC abụghị iwu na mmadụ ga-eji ya zọọ ọkwa gọvanọ.
Ọ kọwara na ruuru ogo ịzọ ọkwa gọvanọ na agbanyeghị ma o tinyere asambodo NYSC ma ọ bụ na o tinyeghi ya.
Ọkaikpe Peter Mbah bụ Justina Ofịa SAN kwuru na ihe agba n'aka ejighi enyo ele ya, nke pụtara na obi juputara ya na aṅụrị na tribunalụ ekwuola ka Mazi Chijioke edoga ga nọrọ ala n’ihi na Peter Mbah meriri ya.
Sinetọ Osita Ngwu nke na-anọchite anya Enugwu west na parti PDP kwuru na obi atọgbuola ya ụtọ maka ya bụ mmeri Peter Mbah meriri taata.
Senator Ngwu gwara ndị niile e meriri ka ha jikọọ aka ọnụ dọnyere Peter Mbah ukwu ka Enugwu gaa n’ihu.
Ndị parti PDP juputara na ihu ulọ ikpe High court Enugwu na-eti mmuọnwu ma na-agụ egwu aṅụri maka na pati ha enwetala mmeri.
Ụlọikpe n'Enugwu ga-enye ikpe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ Enugwu taata
Ụbọchị 21 n'ọnwa Seputemba nke afọ 2023 ka ụlọikpe n'Enugwu ga-enye ikpe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ Enugwu taata.
Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka n'Enugu steetị ga-ekwupụta onye meriri n'etiti Chijioke Edeoga nke Labour Party (LP) na Peter Mbah nke People's Democratic Party (PDP).
Nke a na-eme n'ụlọikpe ukwu dị n'Enugwu steetị (Enugu State High Court).
Ndị ga-ekpebi ikpe a gụnyere mmadu atọ, nke Ọkaịkpe Akano na-edu.
Ndị Enugu na-eche ihe ga-eme, na onye ga-emeri ọkachasị dịka ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka na steeti na Kano steeti kagburu mmeri nke Abba Kabiri nke otu NNPP nwere na ntuliaka e mere na steeti ahụ ma nye ya Nasiru Gawuna nke otu APC.










