Ọ bụ ọkụ 'Natural Gas' ka ọ bụ nke sị na 'Pipe' na-agba n'Amaoji Nike, Enugwu Steeti?

Ọnụ na-ekwuchitere NSCDC bụ Denny Iwuchukwu na-egosi ebe ọkụ a na-agba

Ebe foto si, NSCDC

Ọkụ na-agba n'ogige Mahadum Caritas nke dị na Mahadum Carita dị n'obodo Amaoji, Nike, Enugwu Steeti kamgbe ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee afọ 2022 .

Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọọrụ Nigerian Security and Civil Defence Corps (NSCDC) nke Enugwu Steeti bụ Denny Emmanuel Iwuchukwu kọwara etu ya bụ ihe siri bido.

O kwuru sị, “ Ọ bụ ụlọ akwụkwọ Mahadum Caritas kpọrọ ndị na-egwu olulu mmiri ‘bore hole’ ka ha gwuputara ha mmiri ka ya bụ ọkụ bidoro”.

Iwuchukwu gara n’ihu kwuo, "Ọ bụ mgbe ha gwugidere ruo ihe dịka 'feet' otu puku ka ha gbapuru okporo gassị ahụ nke mere ya bụ ikuku gaasị ji maliate ịpụtawa".

Ọ gara n’ihu kwuo na mgbe ndị ụlọọrụ na-egwupụta mmiri hụrụ ya bụ gaasị, ha wepụtara igwe ha ji egwu ala were gwa ụlọakwụkwọ ihe ha chọpụtara.

Ụlọakwụkwọ na onwe ha gwara ndị ọrụ gọọmentị ihe ha hụrụ n'ogige ụlọakwụkwọ ha.

Otu onye ma ihe na-aga na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ gassị ọnatara chi kpatara ya bụ ọkụ.

O kwuru sị, “Aka Mahadum Caritas apụọla na ya, ugbua ndị ọrụ gọọmentị ewerela ọnọdụ na ya bụ ogige”.

Ndị uweojii Enugwu Steeti edepụtala akwụkwọ nke Kọmịshọna uweojii Steeti ahụ jiri gwa ndị ọha na ọ bụ gaasị akụ ọnatarachi kpatara ya bụ ọkụ.

O kwuru ka ndị mmadụ hapụ ịtụ ụjụ n'ihi na ndị ọrụ gọọmentị dị iche iche ya bụ ihe metụtara na-agba mbọ ịmenyụ ọkụ a.

Mgbe BBC kpọtụrụ onyeisi ndị ụlọọrụ na-emenyụ ọkụ nke Enugwu Steeti, ọzaghị ekwe ntị ya.

Ndị NSCDC azaghịkwa ekwe ntị ha mgbe a kpọrọ ha.