Egbema oil well: Kedụ etu ndọrọ ndọrọ 'oil well' si malite n'etiti Imo na Rivers Steetị?

Ebe foto si, Uzodimma/Rivers Government
Ụlọikpe Kachasị na Naịjiria ekpebiela na ọ bụ Rivas steeti nwe olulu mmanụ agbịdị 17 n'obodo Akiri na Mbele nke okeala dị n'etiti ha na Imo Steeti.
Ọkaikpe Ellen Ogunwumiju na ọkaikpe Emmanuel Agim bụ nọ n'isi ikpe ahụ kachapụrụ mkpesa Imo Steetị mere.
Na mkpebi o mere n'ụtụtụ Fraịde, Mee 6 2022, Ụlọikpe Kachasị kwuru na olulu mmanụ ndị a nakwa nke dị na Ndoni bụcha nke Rivas steeti.
Ụlọikpe Kachasị kwụsịkwara nkwekọrịta dị n'etiti ha nke Gọọmentị Etiti tinyere maka etu e si eke ego ọbụla e ritere n'olulu mmanụ ndị a.
Cheta na oge Emeka Ihedioha banyere ọchịchị dịka gọvanọ Imo steeti n'afọ 2019, ozi si n'ụlọọrụ onyeisiala Naịjiria nyere iwu ka ego niile olulu mmanụ ndị a mịtara gaara ndị Imo steeti.
Mana gọọmentị Rivas steeti gbara akwụkwọ ozugbo n'ụlọikpe iji sị ka a tụgharịa ya bụ iwu si n'aka ụlọọrụ onyeisiala.
Kedụ etu ndọrọ ndọrọ olulu mmanụ a si malite n'etiti Imo na Rivers Steetị

Ebe foto si, Getty Images
Ọ dịla anya nsogbu okeala dị n'etiti Steetị abụọ dịka o si metụta olulu mmanụ agbidi malitere.
Nke a metụtara obodo Akiri na Mbele dị n'okeala Imo na Rivers Steetị bụ ndị nwere olulu mmanụ agbịdị na ha.
N'afọ 1999 mgbe nsogbu okeala a ka na-aga n'ihu, ndị gọvanọ Imo nọ mgbe ahụ bụ Achike Udenwa na ogbo ya nke Rivers bụ Peter Odili nwere nkwekọrịtaka.
Nkwekọrịta ha bụ ka e kee ego erupụtara n'olulu mmanụ agbịdị ahụ n'etiti steetị abụọ n'ụzọ nhatanha.
Ha sị na ọ ga-adị etu a ruo mgbe ụlọọrụ na-ahụ maka okeala bụ National Boundary Commision (NBC) ga-ekewa ala ndị a.
Mana n'afọ 2019 mgbe Gọvanọ Emeka Ihedioha were ọchịchị n'Imo Steetị, o mere mkpesa nye Onyeisiala Muhammadu Buhari ka naanị Imo steetị na-eri ego si n'olulu mmanụ agbidi ndị a.
Ihedioha sịkwara ka Rivers kwụọ Imo ego dị ijeri naịra iri na ise (N15bn) bụ nke ha ketere kamgbe ha nwechara nkwekọrịta ahụ.
Onyeisiala Buhari nyere iwu ka ụlọorụ Revenue Mobilization, Allocation and Fiscal Commission ịkụsa nkwekọrịta dị n'etiti ha.
Nke a mere gọọmentị Rivers Steetị jiri kpọtụrụ ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ka ha leba anya n'okwu ahụ.
Ụlọikpe ukwu kagburu iwu onyeisiala nyere, mana gọọmentị Imo gaghachịrị n'ụlọikpe mkpegharị nke gakwara n'ihu nye gọọmentị Rivers mmeri.
N'otu aka ahụ gọọmentị Rivers mere mkpesa n'ụlọikpe kachasị ma sị ka a chabie okwu banyere okeala ahụ kpamkpam.
N'ụbọchị isii nke ọnwa Mee, ka ụlọikpe kachasị nyere iwu sị ka e nyefee gọọmentị Rivers steetị olulu mmanụ agbidi dị iri na asaa dị n'obodo Akiri na Mbede.
Kedụ ihe Gọọmentị Rivers na Imo Steetị kwuru?
Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivers Steetị sị na obi dị ya ụtọ n'ikpe a ụlọikpe ukwu chabiri ma sị na ọ bụ Gọvanọ Emeka Ihedioha butere nsogbu mere ha jiri gawa ụlọikpe.
Ọ sị na ọ na-atụ anya na Gọvanọ Hope Uzodimma na-achị ugbua ga-anabata ikpe ahụ n'anya ọma.
N'aka nke ọzọ ọkaiwu gọomentị Imo Steetị sị na ha anụla ozi banyere ụlọikpe a mana ha anatabeghi akwụkwọ mkpebi site n'aka ụlọikpe.

Ebe foto si, Imo State Government
Ha sị na ọ tụrụ ha n'anya etu Gọvanọ Rivers Steetị ji na-aṅụ ọṅụ maka ikpe a bụ ha ahụbeghi akwụkwọ ikpe anya.
Ha rịọrọ ka ụmụafọ Imo Steetị dere jụụ dịka ha na-eche ka akwụkwọ ikpe ahụ pụta tupu ha e kwuo okwu.









