Peter Obi: Ihe Wike sara Ohaneze oge ha gara ịjụ ya maka agwa a sị ọ kpara na Ntuliaka Onyeisiala

Nyesom Wike na Ohaneze

Ebe foto si, Nyesom Wike/BBC

Aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike eboola ebubo na ndị rụkara Peter Obi n'ge ntuliaka 2023 bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si Ọwụwa Anyanwụ, na aka ya dị ọcha.

Wike sịrị, "Arụpụghị m Peter Obi na Ntuliaka Onyeisiala"

Ozi na ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-ebo ebubo na Wike mere wuru wuru iji hụ na Obi enwetaghị vootu gbalitere na Rivas steeti dịka a tụrụ anya.

Akụkọ ndị a dịka ọnụ na-ekwuru ndị Ohaeze bụ Alex Ogbonnia si gbaa ama n'ozi o wepụtara kpalitere otu Ọhaneze Ndigbo ịga obi Gọọmentị Rivas Steeti dị na Pọtakọt n'ụbọchị Tọzde, abalị itoolu nke ọnwa Maachị afọ 2023, ịjụta Wike ihe mere na, "Onye Ikwere ga-agba ndị Igbo mgba okpuru n'ọsọ inweta ọkwa onyeisiala site na Peter Obi," dịka Osote Onyeisi Otu Ohaneze bụ Ọkaiwu Peter Aneke si kwuo ya oge ha gara. 

Obi,onye si Ọwụwa Anyanwụ zọọ ọkwa Onyeisiala n'aha otu Labour Party gbara onye nke atọ dịka o nwetara vootu dị nde isii na ụma(6,101,533), ebe Bola Tinubu si Ndịda Anyanwụ (South-West) zọọ n'aha otu APC nwere mmeri dịka o nwere vootu nde asatọ na ụma(8,794,726)dịka Inec si kpọpụta,ebe Atiku Abubakar nke si Ugwu Awusa sotere ya dịka o nwetara vootu nde isii vootu na ụma itool(6,984,520).

Nyesom Wike

Ebe foto si, Nyesom Wike/Facebook

Wike, onye kwuru na ọ tụrụ ya n'anya na ndị Ohaneze bịara ịjụgha ya, sịrị na

"Ọ bụ ndị ọchọnganoko ji konukọrọ olu nakwa onyonyo adịgboroja iji mebie aha m."

“Olu ahụ nke kwuru na Wike na-enye ndị ọrụ Inec ngarị, adịla n'ọbaozi Youtube kemgbe Disemba 16, afọ 2026".

Wike kwuru na oge ndị gọvanọ sị Ndịda Anyanwụ (Southern Governors' Forun) zutere mbụ n'Asaba nakwa n'Enugwu na ihe ha kwekọrịtara bụ "ọchịchị isi na Ugwu gbadata Ndịda ma Muhammadu Buhari chịcha , na " o nweghị mgba a kpara na ọ bụ Ọwụẁa Anyanwụ ka ọchịchị ga-aga.

Wike onye kwuru na ọ bụ ndị a mama si Ọwụwa Anyanwụ rere ndị mpaghara ha oge ntuliaka imeụlọ PDP maka ọkwa onyeisiala sịrị na n'ihe nile ya na-eme n'ọsọ ndọrọndọọ ọchịchị ya na ya gbaliri ịhụ na ya kwụ na "nkwekọrịta nke ndị gọvanọ Ndịda Naijiria kwekọrịtara".

O kwuru na ọ bụ nke mere ka ya nye Peter Obi ohere ịbịa chụọ nta vootu na steeti ahụ, mana ya enyeghị Atiku.

Ọ gara n'ihu jụọ ndị Ohaneze sị, " O nwere mgbe Ohaneze bịara rịọ m ka m nye Peter Obi nkwado?"

Alex Ogbonnia

Ebe foto si, Alex Ogbonnia

Nkọwa foto, Alex Ogbonnia bụ ọnụ na-ekwuru otu Ọhaneze

Na mbụ, Aneke gwara Wike n'obi adịghị Igbo nile n'ụwa gba gburugburu mma ọkachasị banyere ebubo nnukwu wuruwuru ntuliakka a sị mere na Rivas steeti megide Peter Obi.

O kwuru na ọ bụ nnukwu ihe mwute na "Obi meriri Legos, Abuja, na ọtụtụ ebe ndị ọzọ n'Ugwu Awụsa, kpụzị a afọ n'ala na Rịvas."

"Ya mere ndị otu anyị ji ịbịa ịmata n'ihi na ma ndị okeny na ndị ntorobịa Igbo chọrọ ịmata ihe o ji kpachapụ anya chọọ ịkwatu Obi na Rivas steeti.

Ndị ozi Ohaneze gara ije ahụ gụnyere : Prince Nwandu, Onyeisioche Ohaneze Delta Steeti na Emeka Ogwu bụ Osote ya; Ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Chiedozie Alex Ogbonnia; Ezechi Chukwu, Fred Eze, bụ Onyeisioche Onaneze Enugu ; Lucky Ekeji, Onyeisioche Ohaneze Rivas Steeti; Okey Nwankwo, Onyeisioche nke Abia Steeti;na ndị ọzọ nwere agba na Rịvas steeti dịka Chibudom Nwuche.