Ihe ị kwesịrị ima maka nkwụsị Abdulrasheed Bawa n’ọrụ nwa mgbe nta

Abdulrasheed Bawa

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akwụsila Abdulrasheed Bawa ọrụ nwa mgbe nta dịka onyeisi ụlọọrụ na-ebuso nrụrụaka nma mpụ agha na Naịjirịa.

Ozi kwupụtara nke a kọwara na nkwụsị ya n’ọrụ ịchị Economic and Finnacial Crimes Commission, (EFCC) ga-abụ ruo oge enwebeghi onye ma.

Chetakwa na na nso nso a onyeisiala Tinubu nyere iwu ka Godwin Emefiele kwụsị ọrụ ịchị ụlọakụ ukwu Naịjirịa dịka ụlọọrụ DSS na-enyocha ya maka okwu olemole.

Dịka a na-akwụsị Bawa ọrụ nwa mgbe nta, a na-enyo ya onye dị afọ 43 enyo maka okwu etu o siri nwere ikike ọchịchị ya rụọ ọrụ.

E nyekwara ya iwu inyefe onyeisi ọrụ ụlọọrụ ahụ bụ Abdulkarim Chukkol ọchịchị ya ngwa ngwa. Ọ ga-anọ n’elu ọkwa a ruo mgbe e mechara nnyocha nọ n’isi ya.

Nke a so ọtụtụ ebubo dapụtara n’isi Bawa dịka ngalaba ndị uweojii Naịjirịa zoro ezo bụ Department of State Services (DSS) gbara ama na ha akpọola ya oku ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo ndị a.

Na nso nso a, onyeisiala Tinubu nyere iwu ka Godwin Emefiele kwụsị ọrụ ịchị ụlọakụ ukwu Naịjirịa dịka ụlọọrụ DSS na-enyocha ya.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Na nso nso a, onyeisiala Tinubu nyere iwu ka Godwin Emefiele kwụsị ọrụ ịchị ụlọakụ ukwu Naịjirịa dịka ụlọọrụ DSS na-enyocha ya.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ so okwu a

Ọ bụ ezie na ọ na-ewepụkara onye nọ n’isi ụlọọrụ EFCC ozugbo onyeisiala ọhụrụ batara n'ọkwa ọchịchị, ozi gọọmentị Tinubu zipụtara maka nkwụsị Bawa n’ọrụ bụ ozi “dara ụda” nke ebubo ya ebubo dịka onye ji ikike ọchịchị me ihe na-ezighi ezi.

Cheta nwebuola ọtụtụ ebubo nrụrụaka e boro Maazị Bawa kemgbe a họpụtara ya dịka onyeisi EFCC n'afọ 2021, bụ ndị nke ọ gọrọla na aka ya adịghị na ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC Hausa nwere n'ọnwa gara aga, onye bụbu gọvanọ Zamfara steeti boro Bawa ebubo na ọ nara ya ego akaazụ ruru nde dọla abụọ mana gọrọ agọ ebubo ahụ.

Abdulrasheed Bawa

Ebe foto si, EFCC

Onye bụ Abdulrasheed Bawa?

  • Abdulrasheed Bawa onyeisi ụlọọrụ EFCC kacha obere n’afọ n’ọkwa ahụ kemgbe e hibere ya n’afọ 2003.
  • Ọ malitere ọrụ mgbe ọ dị afọ 40 n’oge ọchịchị Muhammadu Buhari mgbe e wepụrụ Ibrahim Magu n’ọkwa ahụ maka ebubo nrụrụaka n’afọ 2020.
  • Bawa so n’otu n’ime onye ọrụ EFCC nwetere ọkwa ‘cadet officer’ na 2005.
  • Ọ natara ọzụzụ na ngalaba akụnụba na mahadum na gụkwanye akwụkwọ na ngalaba ihe gbasara mmekọ mba na mba.
  • Ọ bụ onye bụ onye nọ n’isi nnyocha ebubo nzufu ego nke onye bụbụ minista mmanụ agbidi Naịjirịa bụ Diezani Alison-Madueke.
  • A mụrụ ya n’afọ 1980 dịka o si Kebbi steeti.
  • Ọ bụ onye egwuruegwu bọọlụ, tenịs, ịgụ akwụkwọ nakwa ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n’ụwa na-amasị.
  • Ọ nweteela ọtụtụ asamobodo nakwa ihe nrite n’ọrụ nnyocha nakwa ibuso mpụ na nrụrụaka agha.
Abdulkarim Chukkol

Ebe foto si, EFCC

Ihe ị kwesịrị ịma maka Abdulkarim Chukkol bụ onyeisi EFCC nke nchere oge a

  • O so na ndị malitere ọrụ mbụ oge e hibere ụlọọrụ EFCC dịka ọ natara ọzụzụ na ngalaba ‘Cadet Course One’
  • Ọ bụ onye ọkaibe n’ime nnyocha ndị na-ezu ohi ịntanetị nakwa nzufu oke ego.
  • Ọ rụọla ọrụ n’ime ụlọọrụ EFCC dịka onyeisi nnyocha ego nakwa nke nnyocha nzufu ego ịntanetị Legọs na Abuja malite n’afọ 2011 ruo 2016, onyeisi ọrụ EFCC n’ụlọọrụ Uyo (2017) nakwa n’ụlọorụ Port Harcourt (2020).
  • O sorola ndị ọrụ nnyocha mbaụwa rụọ ọtụtụ ọrụ nnyocha nke gụnyere ụlọọrụ FBI, UK National Crime Agency, United States Postal Inspection Service (USPIS), United States Secret Service, Australian Federal Police, Dutch Police, German Police, South African Police nakwa ndị ọzọ.
  • Ya na ụlọọrụ gọọmentị ndị ọzọ arụkọọla ọrụ iji hibe usoro ọrụ mmanya iwu dịka ọ bụ onye nnọchiteanya Naịjirịa n’otu ụwa nke ‘International Mass Marketing Fraud Working Group’.
  • Ọ meela ọtụtụ ọzụzụ banyere ọrụ nke gụnyere ọzụzụ na mahadum Oxford nke mba Briten dịka ọ natarala ọtụtụ ihe nrite pụrụiche n’ọrụ ya nke rụrụ aka na ọ bụ onye ọkaibe n’ezie.