Ahmed Idris: A tukpuola nwaamadị a bụ odebeego ukwu gọọmentị etiti ụlọ nga

Ebe foto si, EFCC
Nke a dapụtara dịka ọ pụtara ụlọikpe mbụ ya taa bụ Fraịdee ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọst maka ebubo nrụrụaka na izufu ego gọọmentị n'ụzọ ezighi ezi.
Cheta na a kwụsịrị Idris ọrụ nwa mgbe nta onye nọ n'isi ọrụ a kemgbe afọ 2015 maka ebubo okwu dịka a malitere nnyocha n'isi ya. Idris gbara n'ihu ụlọikpe ukwu nke Abuja dịka e kwupụtara ebubo 14 aka nzufu ego gọọmentị Naịjịrịa ruru ijeri narịa otu narị na itolu.
Idris na mmadụ abụọ ndị ọzọ a na-enyo n'okwu kwuru na aka ha dị ọcha n'ebubo a.
Ụlọọrụ na-ebuso nrụrụaka agha na Naịjirịa bụ Economic and Financial Commission (EFCC) nwụchịrị Idris maka ebubo a ebe ụlọikpe ukwu nke Abuja jụrụ arịọrọ ndị a a na-enyo enyo ka a tọhapụ ha ka ha nwee ike isi n'ụlọ na-abịa ikpe a.
Ugbua, ụlọịkpe a enyela iwu ka atụkpuo ndị a n'ụlọ nga ruo mgbe ọzọ ha ga-apụta ụlọikpe bụ ụbọchị Wenezde na-abịa abịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

Ebe foto si, Zainab Ahmed/Facebook
Ihe mere gọọmentị Naịjirịa ji kwụsị odebeego ukwu gọọmentị etiti ọrụ nwa mgbe nta
Minista ego na Naịjirịa bụ Zainab Shamsuna Ahmed enyela iwu ka odebeego ukwu gọọmentị etiti bụ Ahmed Idris kwụsị ọrụ ya n'ike nwa mgbe nta.
Onye enyemaka onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe gbasara soshal midia, ịntanetị na tekunzụ bụ Tolu Ogunlesi gbara ama nke a n'akara Twitter ya n'ụbọchị Wenezde.
O kwuru na e mere nke a iji nwee ike itinye anya n'okwu ebubo na Idris mefuru ego gọọmentị ruru ijeri naịra iri asatọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Cheta na akụkọ a pụtara ihe n'ụbọchị Mọnde dịka ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission, (EFCC) nwụchiri Idris maka okwu ebubo a.
EFCC depụtara na ha nwụchiri Ahmed Idris maka ebubo imefu ego karịrị ijeri naịra iri asatọ (N80billion).
Dịka ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwajuren si kọịwaa n'ozi mgbasaozi o binyere aka, a nwụchiri Idris n'ihi na ọ jụrụ ịza oku ndị EFCC kpọrọ ya ugboro ugboro ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ebubo a.
Ọ kọwara na akatamkpo ego ahụ bụ ego gọọmentị nke Idris ji ụzọ mpụ na nrụrụaka dị iche iche nyefee onwe ya.
Ha kwuru a Idris ji ego ahụ zụọ ọtụtụ ụlọ na Kano nakwa Abuja n'aha ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya.
Onye bụdị Ahmed Idris?
- Idris bụ onye onyeisiala Muhammadu Buhari họrọ n'ọrụ nabalị 25 nke ọnwa Juun afọ 2015 dịka ọ chụchara Jonah Ogunniyi Otunla maka ebubo imefu ijeri Naira abụọ na ụma ise ego nchekwa.
- Buhari họkwara ya n'ọrụ ọzọ n'afọ 2019 ka o nwetara mmeri ịchị agba nke abụọ n'afọ 2019.
- Idris bụbụ diretọ na ministri na-ahụ maka igwipụta ọnatarachi n'ala na igwe.
- A ma Idris dịka onye danyela n'ọtụtụ okwu na ụka; ụka metụtara ịnọfe afọ ole o kwesịrị, mmefu ego na ịgha ụgha.
- Idris alaghị ezumike nka ka o gbara afọ 60 n'ọnwa Novemba afọ 2020 dịka iwu ọrụ oyibo Naijiria siri kwuo mana onyeisiala hapụrụ ya n'ọkwa ya
- N'ọnwa Eprelụ, afọ 2021, otu na abụghị nke gọọmentị a kpọrọ "Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) degara Ọkaiwu Ukwu nker Gọọmentị eakwụkwọ na-arịọ ka enyocha Idris maka ego ruru ijeri ₦106 a na-achọ achọ bụ ego a mapụtara na bọjet afọ 2018 maka mịnịstri na ngalaba dị iche iche.









