Ịzụ nchi na-enye m karịa N1,000,000 kwa ọnwa - Chinedu Eleuwa

Nchi so na otu n'ime nrị na-amasị ndị bi na Naijirịa, ọkachasị ndị bi n'ọwụwa anyanwụ Naijirịa.

Nchi bụ anụ ọhịa kama akụkọ a bụ maka ndị bidoro ịkpa nchi dịka anụ ụlọ na anụ ha ji agba mgbere.

Chinedu Eluwa onye eji 'Eze Nchi' mara ma bụrụkwa onyeisi Grasscutter Farmers Association of Nigeria kọọrọ BBC Igbo etu o siri bido ịzụ nchị.

Onye ọzọ tinyere ọnụ n'ọkwu a bụ ọkammụta Cordelia Ebenebe bụ onye ọkaibe na sayensi n'ihe gbasara ụmụ anụmanụ.

Oriakụ Ebenebe bụ kwa onye nyochara ma gụọ maka nchị nke ọma nke bekee na-akpọ 'Doctorate'.

Ọ kọwara na nchị na-edozi ahụ nke ọma ma sịkwa na ebido zụwa nchi ebe ọ dị ukwu na ọ ga-enyere aka kwalite etu ndị Naijirịa , ọkachasị ndị bi n'ọwụwa anyanwụ na-etu ha si azụ nchi.

Ebenebe kọwara etu ịzụ nchị si akwado ọdịmma mbara ezi n'ihi na ọ na-egbochi ndị dịnta isu ọhịa ọkụ mgbe ha na-achụ nta nchị.

N'akla nke ọzọ ka Eluwa gosiri etu onye bị n'ọnụ ụlọ n'obodo mepere emepe ga-esi azụ nchị.

Ọ gwara BBC Igbo na ọ na-akpata ihe karịrị otu nde Naira site n'ire na ịkuziri ndị mmadụ etu esi azụ nchi.

Lee ihe onyonyo a ka ị ghọta akụkọ a n'uju.