Foto gosiri ndụ Buhari dịka onyeisiala n'ọchịchị ndịagha na ọchịchị onye kwuo uche ya

Mgbe Buhari oyi uwe ndịagha, guzoro na-azụ ụgbọala mepere emepe. Ndịagha atọ yikwa uwe agha nọkwa n'ime ụgbọala ahụ, nke na-egosi na ọ nọ n'ọgbọ egwuregwu.

Ebe foto si, Sygma via Getty Images

    • Onye dere ya, Wedaeli Chibelushi
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ndụ Muhammadu Buhari sochiri mgbanwe dị egwu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Naịjirịa n'ime afọ iri ise gara aga.

Onye ahụ bụbu onyeisiala Naịjirịa, nwụrụ n'ụbọchị Sọnde oge ọ dị afọ 82, ọ bụ onye ọchịagha chịburu mba Naịjirịa ka akwaturu ọchịchị mana ndị ọchịchị ọhụrụ tụrụ ya mkpọrọ.

Ọ laghachitere ọtụtụ iri afọ iji nweta ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka nke ọchịchị onyekwuouche ya.

Foto ojii na ọcha na-egosi Buhari mgbe oyi uwe na tie ma guzoro n'akụkụ Eze Gustaf nakwa Sheikh Yamani

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Foto esetere Buhari n'afọ 1977 ebe ya na onye bụbu Eze mba Sweden Carl XVI na Sheikh Ahmed Zaki Yamani nke mba Saudi Arabịa nọ n'afọ 1977 - ọ malitere ọrụ dịka onye otu ndịagha ka ọ gụchara ụlọakwụkwọ.

Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp

Mgbe obere oge gachara, n'afọ 1983, ndịagha kwaturu ọchịchị Shehu Shagari bụ onyeisiala.

Mgbe Buhari oyi uwe ndịagha, guzoro na-azụ ụgbọala mepere emepe. Ndịagha atọ yikwa uwe agha nọkwa n'ime ụgbọala ahụ, nke na-egosi na ọ nọ n'ọgbọ egwuregwu.

Ebe foto si, Sygma via Getty Images

Buhari nọ n'aka nri ebe osote ya na-ịzọ ọkwa onyeisiala bụ Chuba Okadigbo nọ n'aka ịkpe nakwa onyeisioche ọtụ ndọrọndọrọ ọchịchị ANPP bụ Don Etiebet

Olusegun Obasanjo meriri Buhari na ndọrọndọrọ ọchịchị afọ 2003 mana ọzọkwara ọchịchị ọzọ n'afọ 2007 na 2011 mana ọ dakwara

Buhari, osote ya na-ịzọ okwa onyeisiala bụ Chuba Okadigbo na onyeisioche pati All Nigeria People's Party bụ Don Etiebet, na-achi ochi ma welite aka ha jịkọtara ọnu n'elu isi ha.

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Ndị ntoroọbia na-eme ngharịiwe n'okporoụzọ Kano steeti - otu onye ji foto Buhari, ndị ọzọ ji osisi n'aka dịka anwụrụ ọkụ n'apụta n'akụkụ ebe ha nọ.

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Muhammadu Buhari nọ ọdụ n'ihu ọkọlọtọ Naịjirịa n'akara na-ekwu United States Institute of Peace. O yi uwe ojii, okpu ojii na enyo anya.

Ebe foto si, AFP via Getty Images

N'ọgbakọ juru n'ọnụ, ọtụtụ ndị nkwado na-agba mbọ imetụ Buhari onye guzoro n'elu na-achị ọchị aka. O yi uwe na okpu n'isi.

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Otu nwaanyị kwụ n'akụkụ akwụkwọ nke Buhari nọ n'ime ya ma na-achị ọchị. O yi uwe elu nke e dere "APC" na "Buhari".

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Buhari kacha ewu ewu na mpaghara ugwu Naịjirịa, ebe a muru ya.

Onye arụrụ arụ ka Buhari, nke bu okwu "Sai Baba Inshallah", guzo n'etiti okporoụzọ uzuzu juru. Otu ọgba tum tum na-agafe.

Ebe foto si, AFP via Getty Images

N'ebe a, akara na-e osipụta n'obodo Kaduna n'oge ntuliaka 2015, na-agwa ndị na-agafe agafe na ndị obodo ga-atụnyere naanị "Baba" Buhari.

Emechara họpụta Buhari dịka onyeisiala n'afọ 2015, ma merie onyeisiala Goodluck Jonathan nọ n'ọchịchị.

Aha ya banyere n'akụkọ ihe mere eme, dịka ọ bụrụ onye mbụ nọ na pati mmegide meriri na ntuliaka dịka onyeisiala.

Ọ bụ ezie na Buhari weere ọrụ dịka ọchịagha, mana ọ gọrọ agọ na ya so kpaa nkata iweghara ọchịchị n'ike mana akụkọ ndị ọzọ kọwaara Buhari dịka onye gbara ezigbo mbọ iweghara ọchịchị n'ike.

Dịka e wepụrụ ya mgbe ọ chịrị afọ abụọ ma tinye ya n'ụlọmkpọrọ maka iji aka ike soro ndị nrụrụaka na imejọ ikike mmadụ, Buhari zọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2003 site n'ọchịchị onyekwuouche ya na otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Nigerian Peoples patị (ANPP)

Bọọdụ mgbasaozi APC e dere "anyị ga-emeri Boko Haram #ụmụafọ Naịjirịa ọ bụla nwere ọnụ". Okwu ndị nọ na foto onye agha nọ n'ime ya ma yiri ngwa ọgụ nakwa egbe.

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Muhammadu Buhari yi ogologo uwe na okpu ọcha ma jiri ekwenti n'aka ịnata ozi ekele n'aka onyeisiala Goodluck Jonathan

Ebe foto si, Red Media Africa

Ka o were ọrụ dịka onyeisiala, oge mbụ ya n'okwa butere nsogbu dịka akụnaụba Naịjirịa malitere ịla azụ oge mbụ kemgbe afọ iri.

Ihe gbasara nchekwa nke mba Naịjirịa malitere ịjọ njọ mana mgbe nwaanyị ya katọrọ gọọmenti ya, iwe were Buhari o jiri kwuo na nwannyi ya kwesiri ịno n'ime ụlọ ngwa nri bụ kichin.

Buhari guzoro n'akụkụ nwunye ya. Ha abụọ yi ugogbe anya n'uwe ọcha.

Ebe foto si, AFP via Getty Images

N'agbanyeghị nsogbu o nwere n'oge ọchịchị ya mbụ, a họpụtara Buhari ọzọ n'afọ 2019. Dịka onyeisiala, ọ gara ụwa niile, na-aga nzukọ ndị dị elu ma zute ndị isiala ibe ya.

Na foto a Buhari na ezenwaanyị Queen Elizabeth mgbe ha na mkparịtaụka, na-achị ọchị.

Ebe foto si, John Stillwell/Getty Images

Ezenwaanyị Briten, Queen Elizabeth na-ekele Buhari n'ọgbakọ ndị isi Commonwealth na 2015.


Barack Obama nọ n'ele Buhari anya mgbe ọ na-ekwu okwu

Ebe foto si, AFP via Getty Images

N'afọ 2015, Onyeisiala Amerịka bụ Barack Obama nabatara Buhari n'obi ochịchị mba ahụ bụ White House.

Donald Trump na Muhammadu Buhari nọ na-akparịtaụka dịka ha na-agagharị n'obi ọchịchị mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

N'afọ 2018, Buhari bụ onye ndu mbụ si na mpagahara Afrịka zutere onyeisiala Donald Trump n'isi obodo Washington.

Na foto a, Muhammadu Buhari na Praịm Minista Narendra Modi yi uwe ọcha ma na-ekwe n'aka

Ebe foto si, Hindustan Times via Getty Images

Buhari na-akpọbata Christine Lagarde, onye bụbu onyeisi ụlọọrụ nke International Monetary Fund

Buhari na-anabata Christine Lagarde, onye bụbu onyeisi ụlọọrụ nke International Monetary Fund

Ebe foto si, Bashir Ahmad/X

Nkọwa foto, Buhari na Christine Lagarde

Nke a bụ onyeisiala Muhammadu Buhari mgbe ọ na-apụ n'ọchịchị dịka onyeisiala n'afọ 2023.

Nke a bụ mgbe onyeisiala Muhammadu Buhari hapụrụ obi ọchị Naịjirịa a kpọrọ Aso Rock Villa mgbe ọ rụchara ọrụ ya n'afọ 2023.

Ebe foto si, Bashir Ahmad/X

Nkọwa foto, Buhari oge ọ n'apụ n'ụlọọrụ

N'oge ọnwụ ya n'ụlọọgwụ dị na Lọndọn, ụfọdị ndị mmadụ na-echeta Buhari dịka nwoke imejupụtaghị nkwa o kwere ụmụafọ Naịjirịa, ndị ọzọ ga-echeta ya dịka onye gbara mbọ ka ike ya dị n'agbanyeghị ka ihe siri dị.

Jonathan kọwaara Buhari dịka onye "na-adịghị achọ ọdịmma nke onwe ya na-ọrụ ma jere obodo ya ozi n'ọdị ịhụ mba n'anya".


Mmadụ gosipụtara akwụkwọ akụkọ bu isi akụkọ na-akọ ọnwụ Muhammadu Buhari.

Ebe foto si, Reuters

Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gi.

Gụọ akụkọ ndị ọzọ na WhatsApp chanelụ anyị
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Soro anyị na BBCIgbo.com maka akụkọ ndị ọzọ.

Sonyere anyị na Facebook BBC News Igbo, WhatsApp Chanelụ BBC News Igbo nakwa Instagram bbcnewsigbo