Muhammadu Buhari: Ihe ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa kwuru maka ọchịchị ya

Aha onyonyo, Ihe ụfọdụ ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa kwuru maka ọchịchị Muhammadu Buhari
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Kemgbe akụkọ pụtara na onye chiburu Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari anwụọla, ndị mmadụ na-ekwu ọtụtụ ihe ha ga-eji cheta ya.

N'ihe onyonyo ahụ dị n'elu ka ufọdụ ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa sokwa na ndị kwuru ihe ha chere maka ọchịchị ya mgbe ọ dị ndụ dịka Onyeisiala Naịjirịa.

Cheta na Muhammadu Buhari nwụrụ n'ụbọchị Sọnde, Julai 13, 2025 n'ụlọọgwụ dị na Lọndọn dịka ọ gbara afo 82.

Gọọmenti etiti tinyela ezumike ọrụ n'ụbọchị olili ozu Muhammadu Buhari

Buhari na Tinubu

Ebe foto si, Tinubu/Buhari/X

Nkọwa foto, Buhari na Tinubu

Gọọmenti etiti Naịjirịa amanyela ezumike ọrụ maka olili ozu Onyeisiala chịburu Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari.

A ga-eme olili ozu ahụ echi bụ Tuzde, Julai 15, 2025 dịka ozi si n'ụlọọrụ Mịnịsta na-ahụ maka ime obodo bụ Olubunmi Tunji-Ojo si kwuo, mana ọ bụ odeakwụkwọ mịnịstịrị ahụ bụ Magdalene Ajani binyere aka na ya.

Cheta na Muhammadu Buhari nwụrụ n'ụbọchị Sonde, Julaị 14, 2025.

Ha sị na ihe mere ha ji tinyere ndị ọrụ ezumike bụ ịkwanyere Buhari ugwu ikpeazụ.

Muhammadu Buhari bụbu Onyeisiala Naịjirịa anwụọla n'afọ 82

Buhari

Ebe foto si, Buhari/X

Nkọwa foto, Muhammadu Buhari

Onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari anwụọla n'afọ iri asatọ na abụọ n'ụlọọgwụ na mba ofesi.

Dịka Onye bubụ ọnụ na-ekwuru gọọmenti bụ Garba Shehu si gwa BBC, "Buhari nwụrụ n'ụlọọgwụ na London".

Buhari rụrụ ọrụ dịka ọchịagha ndị agha Naịjirịa ma chịa dịka onye agha nakwa onye nkịtị.

N'afọ 1985 ka ọchịagha Ibrahim Babangida kwaturu ọchịchị ya mgbe ọ na-achị Naịjirịa dịka onye agha.

Mana Buhari mechere chịa Naịjirịa afọ asatọ site n'afọ 2015 ruo n'afo 2023 dịka onye nkịtị.

"Ọkọlọtọ niile na Naịjirịa ga-agbadata ụbọchị asaa" - Onyeisiala Tinubu

Onyeisiala Naịjiria bụ Ahmed Tinubu enyela iwu ka ọkọlọtọ gbadata na mpaghara niile na Naịjiria ruo ụbọchị asaa malite taa bụ ụbọchị Sọnde 13 Julaị, 2025 iji kwanyere ọnye bubu Onyeisala Naịjiria Muhammadụ Buhari ugwu nke ikpe azu maka ọnwu ya.

Tinubu kpọkwara nnọkọ ihe mberede Federal Executive Council na Tuzdee, anyị ga-eji nzụko ahụ kwanyere Buhari ugwu na nsọpụrụ

Ọ si na gọọmenti etiti ga-enye onyeisiala Buhari nsọpụrụ steeti zuru oke nke dabara na nnukwu onyinye o nyere obodo anyị nakwa ka o si gara Naịjiria ozi mgbe ọ dị ndụ

Tinubu kọwara na oji obi mgbu nabata akụkọ ọnwu onye nyefere ya ọchịchị n'aka onye nke nwụrụ n'ụbọchị Sọnde 13 Julaị, 2025 n'ụlọọgwụ dịna mpaghara United Kingdom.

O kwuru n'onyeisiala Buhari bụ onye ụdi o ji jere Naịjiria ozi na ịchụ aja ya ga-adịgide. O bidoro ịgara Naịjiria ozi site onye ndu ndị nchekwa malite na Januarị 1984 ruo ọgọst 1985 dịka o mechara bụrụ onyeisiala na afọ 2015 rue 2023.

Onyeisiala Bola Tinubu na ndị ọzọ ọnụ na-eru okwu na ihe ha na-ekwu maka ọnwụ Buhari

Onyeisiala Naịjiria bụ Ahmed Tinubu enyela iwu ka ọkọlọtọ mba niile gbadata na mpaghara niile na Naịjiria ruo ụbọchị asaa malite taa bụ ụbọchị sọnde 13 Julaị, 2025 iji kwanyere ọnye bubu onyeisala naịjiria Muhammadụ Buhari ugwu nke ikpe azu maka ọnwu ya.

Tinubu kpọkwara nnọkọ ihe mberede Federal Executive Council na Tuzdee, anyị ga-eji nzụko ahụ kwanyere Buhari ugwu na nsọpụrụ

Onyeisiala Tinubu na Osote ya Kassim Shettima

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu a gwala Kassim Shettima bụ osote ya ka ọ gaa mba Briten nata ma soro kpọlata ozu Buhari mgbe a na-eli ya.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ si na gọọmenti etiti ga-enye Onyeisiala Buhari nsọpụrụ steeti zuru oke nke dabara na nnukwu onyinye o nyere obodo anyị nakwa ka o si gara Naịjiria ozi mgbe ọ dị ndụ

Tinubu kọwara na o ji obi mgbu nabata akụkọ ọnwu onye nyefere ya ọchịchị n'aka onye nke nwụrụ n'ụbọchị Sọnde 13 Julaị, 2025 n'ụlọọgwụ dị na mpaghara United Kingdom.

O bidoro ịgara Naịjiria ozi site onye ndu ndị nchekwa malite na Januarị 1984 ruo ọgọst 1985 dịka o mechara bụrụ Onyeisiala na afọ 2015 rue 2023.

Onyeisiala Cyril Ramaphosa nka mba Saut Afrịka

Onyeisiala mba Saụt Afrịka Cyril Ramaphosa ezitela ozi nkasi obi nye ezinụlọ, gọọmentị Naịjiria nakwa ndị amaala maka ọnwu onye bubu onyeisiala Muhammadu Buhari onye nke gbara afọ 82

President Ramaphosa si na ndị obodo ya kwu naịjiria na-azu ọge iri uju a ma kọwa na onwere ohere iso onyeisiala Buhari nwụrụ anwụ na-arụkọ ọrụ mmekọrịta n'etiti obodo Saụt Afrịka nakwa ịkekọrịta ọtụtụ nleta nzaghachi- nke gụnyere oge ọrịa COVID-19.

Ramaphosa sị na ọchịchị Buhari wetara ịdị na otu n'etiti Naịjiria na Saụt Afrịka site na mmekọrita gunyere omenala, agụmakwụkwọ, ugbo, ahia na itinye ego, Ngwuputa, nchekwa, mbata na ọpụpụ nakwa sayensị na teknụzụ.

Onyeisiala Cyril Ramaphosa nka mba Saut Afrịka

Ebe foto si, Ramaphosa/X

Nkọwa foto, Onyeisiala Cyril Ramaphosa nka mba Saut Afrịka

Ihe ndị otu AU kwuru maka ọnwụ Buhari

Onyeisioche otu jikọrọ mba Afrịka niile ọnụ African Union Commission na bekee Mahmoud Ali Youssouf esorola gọọmenti na ndị obodo Naịjirịa iri uju maka ọnwụ onye bubu Onyeisiala, Muhammadu Buhari

N'ozi ya nke o bipụtara na soshial media, ọ kwuru na Mba Afrịka ga-echeta Buhari dịka onye ndụ nwere ụkpụrụ jiri nsọpụrụ jere Naịjiria ozi.

Site na ọchịchị ya dịka onyeisiala, ọ kwenyere na Pan-Africanist, onye na-akwado njikọ mpaghara, ezigbo ọchịchị na ihu n'udo chịrị na Mba Afrịka niile

Ihe ndị otu AU kwuru maka ọnwụ Buhari

Ebe foto si, AU na X

Nkọwa foto, Ihe ndị otu AU kwuru maka ọnwụ Buhari
Ihe ndị otu AU kwuru maka ọnwụ Buhari

Ebe foto si, AU na X

Nkọwa foto, Ihe ndị otu AU kwuru maka ọnwụ Buhari

Onyeisiala Goodluck Jonathan edeela ihe maka ọnwụ Buhari

Onye bubu Onyeisiala Naịjiria Goodluck Jonathan akọwala ọnwụ onye otu ya Muhammadu Buhari dịka ihe nwute.

"Ọnwụ anapụlam m onye ọrụ ibe m na onye okenye a na-akwanyere ugwu"

Dịka ọ na-ayọ ka Chineke n'abata mkpụrụ obi ya n'udo, ọ kwuru na-aga echeta Buhari maka ọrụ ọma ndị ọ rụrụ

Onye bubu onyeisiala Naịjiria Goodluck Jonathan akọwala ọnwụ onye otu ya Muhammadu Buhari dịka ihe nwute.

Ebe foto si, Jonathan/X

Nkọwa foto, Onye bubu onyeisiala Naịjiria Goodluck Jonathan akọwala ọnwụ onye otu ya Muhammadu Buhari dịka ihe nwute.
Onyeisiala Muhammadu Buhari na Onyeisiala Goodluck Jonathan na mmemme n'Abuja

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari na Onyeisiala Goodluck Jonathan na mmemme n'Abuja
Ihe onye bụbụ osote Onyeisiala Atiku dere maka ọnwụ Buhari

Ebe foto si, Atiku/X

Nkọwa foto, Ihe onye bụbụ osote Onyeisiala Atiku dere maka ọnwụ Buhari
Okwu Atiku maka ọnwụ Buhari ka ọ nwụrụ

Ebe foto si, Atiku Abubakar/X

Ihe Atiku Abubakar kwuru maka ọnwụ Onyeisiala Buhari

Atiku Abubakar onye ji patị APC zọọ okwa ọchịchị onyeisiala na afọ 2023 ekwuola na ọnwụ onye bubu onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari wutere ya nke ukwu.

Ọ kọwara na Buhari biri ndụ jupụtara n'ịhụ mba Naịjiria n'anya na-enweghị atụ, ịdọ aka ná ntị nakwa ịdị n'otu.

Buhari abụghị sọsọ onye bụbu onyeisiala Naịjiria, ọ bụ ihe ngosi ikwụsi ike na mgbaasị ike nke e jiri mara ndị Naijiria. Site n'ọgbọ agha ruo n'ụzọ ndọrọndọrọ ọchịchị , o jere ozi n'ụdị nkwenye siri ike nke gosipụtara ya dị ka onye agha nke nwere ụkpụrụ na-onye ndu nke uche nke ya

Dịka ọ na-ekpe ekpere ka Allah nye ezinụlọ ya na ndị ọgbata obi ya ike Iji diie ọnwụ ya, o jikwara ohere ahụ kwuo na Buhari nyere ndụ ya ijere Naijiria ozi ma ghara ịla azụ na nkwenye ya.

Peter Obi edekwala ihe maka ọnwụ Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, Peter Obi/X

Nkọwa foto, Peter Obi edekwala ihe maka ọnwụ Onyeisiala Buhari

Peter Obi edekwala ihe maka ọnwụ Onyeisiala Buhari

Enwetala m akụkọ dị mwute banyere ọnwụ onye bubu Onyeisiala Naịjiria Muhammadu Buhari na London.

Ọnwụ ya na-enye oge dị egwu ọ bụghị naanị maka ezinụlọ ya na ndị enyi ya, mana maka onye ọbụla. Dịka onye ndu, Buhari bụ onye dobere onwe ya mgbe niile n'ụzọ dị ugwu

Ana m asị nwunye ya, ụmụ ya, ezinaụlọ ya, na ndị Naijiria niile nwe nkasi obi dịka m n'arịọ ka Allah Onye amara na Onye-ebere, gbaghara emezighị emezi ya ma kwụọghachi ya ụgwọ mbọ niile ọgbarala Naịjiria ma nabata mkpụrụ obi ya