Aka akparala onye a sị nọ n'isi ndị gbara agagdi nwaanyị ọkụ n'Abagana

Ebe foto si, Anambra State Police
Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola na ha anwụchiela otu onye a na-enyo nọ n'isi ogbugbu e gburu nwaanyị dị afọ iri asaa na anọ n'obodo Abagana dị n'Okpuruọchịchị, Njikoka.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na a nwuchiri nwamadị ahụ ebe ọ gbagara.
Akụkọ kwuru na nwamadị a na mmadụ atọ ndị ọzọ kpara nkata ma mụnye nwaanyị ahụ ọkụ dịka ọ nọ n'igwe 'wheelchair' n'ụbọchị 25 Jenụwarị 2025.
Akụkọ gara n'ihu kwuo na ndị a gara zụta igbe ozu ka ha lie nwaanyị tupu ndị uweojii awụchiela ebe ahụ.
Etu ihe a siri mee
Ndị uweojii Anambra Steeti anwụchiela mmadụ ano a na-enyo enyo na aka ha dị n'ịgba otu agagdi nwaanyị ọkụ n'obodo Abagana.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na agadi nwaanyị a dị afọ iri asaa na ano (74yrs) a gbara ọkụ na-eji igwe na-enyere ndị ngwọrọ aka ịga ije a kpọrọ 'wheel chair' na bekee.
Ọ gara n'ihu kwuo na mmadụ anọ a ndị uweojii nwuchiri n'isi ụtụtụ ụbọchị Sọnde 26 Jenụwarị, 2025 gụnyere otu nwagbọghọ dị afọ iri abụọ na otu
Ikenga kwuru na n'ajụjụ ọnụ a gbara nwagbọghọ ahụ, o kwuru na ọ bụ enyi ya nwoke bụ onye a na-achọ achọ ugbua na mmadụ atọ ndị ọzọ mụnyere nwaanyị ọkụ, ọ nwụọ. Na ha gara n'ihu zụta igbe ozu ha ga-eji eli nwaanyị ahụ.
Dịka ha na-achọ ịchịkọta anụ ahụ nwaanyị ahụ ka ha tinye ya n'igbe lie, ka ndị uweojii bịara jide mmadụ anọ ebe otu onye gbara ọsọ.
O kwuru na ndị ọrụ nchekwa ka na-esi imi n'ala ịchọpụta ma nwuchie nwokoroọbịa ahụ gbara ọsọ.
A na-apụtara ndị a igbe ozu, anụ ahụ agadi nwaanyị ahụ reere ọkụ na igwe na-enyere ya aka ị ga ije.
Kedụ ihe gọọmentị Anambra chọpụtara?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Na njem Kọmishọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ Ify Ibinabo mere n'obodo ahụ, a chọpụtara na nwaanyị e gburu mụrụ ihe ruru ụmụnwaanyị asatọ bụ tocharala eto.
Mana ọ dịka onweghi onye n'ime ya na nwaanyị ahụ bi n'ụlọ iji maara kpọmkwem onye gburu maọbụ ihe mere nne ha.
Otu nwoke bụ onye nwanne ha kwuru na ọ bụ n'abalị Satọde ihe dịke elekere iri nke abalị ka ọ natara ozi na ọkụ gbara nwaanyị ahụ, mana mgbe o ruru ebe ahụ onweghi onye kọwaara ya ọfụma etu e si gbuo nwaanyị ahụ.
Nwoke a so n'otu n'ime ndị uweojii nwuchiri maka na o so na ndị gara zụta igbe ozu
N'ime ihe niile a enwebeghi a chọpụtabeghi kpọmkwem onye gburu nwaanyị ahụ.
Otu nwoke bụ onye obodo Abagana na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ na-agbagwoju ndị obodo ha anya etu ụdịrị arụ ndị a si e mee n'obodo ha.
O kwuru na ọ na-ewute ha na obodo ha bụ ebe a kpụụ n'ọnụ ugbua na-abụghị n'ihi akụkọ kama na ọ bụrụ n'akụkọ ọjọọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị obodo ha na-enwe nzukọ n'ụbọchị Mọnde iji leba anya n'ọnọdụ nchekwa nakwa ihe ndị ọzọ na-eme.
Nke a na-abịa n'ime otu izuụka otu nwoke gbara nwunye ya ọkụ ma gbuo ya, mgbe ha na-ese okwu n'Abagana.









