Ihe mere anyị ji wepụ 'Poster' ndị 'Labour Party' - Gọọmentị Anambra Steeti

Peter Obi na Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Anambra State Govt

Gọọmentị Anambra Steeti akọwaala ihe mere ja ji wepụ ọkọlọtọ na akwụkwọ achụmnta vootu ndị 'Labour Party' n'ebe dị icheiche na steeti ahụ.

Nkọwa a na-abịa dịka akụkọ na-efesa na soshal midia na ọ bụ Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo nyere iwu ka e wepụ ọkọlọtọ ndị ahụ n'ihi na ọ naghị akwado Peter Obi, bụ onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na 'Labour Party'.

Mana Kọmishọna mgbasaozi Anambra Steeti bụ Paul Nwosu akọwaala na ọ bụ ndị 'Labour Party' dara iwu n'ihi na ha ekweghị akwụ ụgwọ gọọmentị sị ka otu ndọrọndọrọ ọchịchị niile kwụọ iji tinye ọkọlọtọ ha ji achụ nta vootu.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Etu okwu a si malite

Onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party n'Anambra steeti bụ Emeh Ugochukwu wepụtara onyonyo mgbasa ozi ebe o boro ebubo na ọchịchị Anambra steeti na-ewepụ foto na posta Peter Obi na ndị ọzọ ji ọkọlọtọ Labour Partry achụ nta vootu.

Emeh kwuru sị, "Dịka m na-ekwu okwu ugbua, ọchịchị Anambra Steeti na-ewepụ foto na posta ndị otu Labour Party ji achụ nta vootu. Anyị kwụrụ ụgwọ dịka ndị na-erubere iwu gọọmentị isi."

"Anyị tinyere akwụkwọ ka anyị tinye foto achụmta vootu nke patị anyị n'ahụ poolu ọkụ n'okporoụzọ kama gọọmentị ekweghị mana o doro mmadụ nile anya na foto ndị patị ndị ọzọ nọcha n'ahụ poolu ndị a".

"O ruru ịjụ ajụjụ ihe mere gọọmentị Anambra steeti jị akpagbu otu Labour Party. Anyị na-akatọ mkpagbu a n'ụzọ niile".

Peter Obi na Chukwuma Soludo

Emeh gara n'ihu kwuo na ndị Anambra Steeti niile, agbanyeghị otu patị ha nọ nwere obi ụtọ mgbe ndị otu All Progressive Grand Alliance họpụtara ma merie ntụlịaka ọchịchị steeti ahụ.

"Mana ugbua, o doola mmadụ niile anya na ihe a tụrụ anya abụghị ihe anyị na-ahụzị ugbua".

O ji ohere ahụ rịọ ndị otu Labour Party na ndị Anambra steeti ka ha deere duu agbanyeghị nsogbu a na-enye ha.

"Ụfọdụ mgbe, onye ahụ ị na-achụpụ, nwereike gbaga n'ebe ihe ga-adịrị ya na mma karịa ebumnobi onye ahụ na-achụ ya," ka Eme kwuru.

'Anyi gwara ha kamgbe ọnwa atọ ka ha kwụọ ụgwọ ha' - Gọọmentị Anambra Steeti

Paul Nwosu

Ebe foto si, Anambra Govt

Nkọwa foto, Paul Nwosu bụ Kọmishọna mgbasaozi Anambra Steeti
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra Steeti bụ Paul nwosu tinyere ọnụ na ya bụ ọkwụ ma sị na enweghị mgbe gọọmentị ji sị ka ewepụ poster Labour Party maọbụ nke Peter Obi n'ihi na ihe niile nwere usoro.

Nwosu gwara BBC Igbo sị, "Onyeisi ụlọọrụ Anambra State Signage and Advertisement Agency dere akwụkwọ gwa ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị niile nọ n'Anambra Steeti ma gwa ha ego ole a na-akwụ maka 'Billboard' na foto mgbasaozi ndị ọzọ nke gụnyere ndị chọrọ itinye foto ndị a n'ahụ ụgbọala ha.

"E degaara ụlọọrụ niile na-ahụ maka mgbasaozi akwụkwọ gwa ha ka ha gwa ndị ha na-arụrụ ọrụ maka iwu a".

"Mgbe oge ruru, ụfọdụ ndị rubere isi na iwu ahụ, ebe ndị ọzọ erubeghị ya isi."

Nwosu kọwara na a na-akwụ ụgwọ ịtịnye ihe mgbasaozi na mbara ezi na steeti niile.

O kwuru sị, "Ndị na-akwụghị ụgwọ ewepụ nke ha. Gọọmentị na-akwado ma na erubere iwu isi."

Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ ebe a ka gọọmentị si enweta ego ha ji edozi obodo.

O kwuru sị, "E nyere ha ọnwa atọ ịkwụ ụgwọ ha, mgbe ha na-akwụghị ya ewepụnụ ihe mgbasaozi ha".

"Enweghị ihe gọvanọ anyị nwere megide Peter Obi...n'ụbọchị gara aga ka Gọvanọ nyere ikike ka Peter Obi were ogige SSG nke dị n'ime obi gọọmentị Anambra Steeti mee emume achụmnta vootu ya".

Gbasara itinye 'poster' na poolu ọkụ?

Nwosu zara sị, "Ọ bụrụ na i tinyere akwụkwọ maka ohere ịmado poster na 'Street Light' ebe ndị ọzọ enwetala ikike ma tinye akwụkwọ nke ha, a ga-ewepụ nke ha tinye nke gị?

O kọwara na ohere itinye foto achụmnta vootu na poolu ọkụ ndị a nwere naanị obere oge.

O kwuru sị, "E nyere ha akwụkwọ kamgbe ọnwa atọ maka nke a, ọ bụzị ugbua oge ruwere a ga-adọpụ nke ndị ọzọ were tinye nke ha".

O kwuru na ọ bụ ndị bu ụzọ tinye akwụkwọ ka ha nyere ohere.

"Onye ọchịchị anyị kwenyere n'ọchịchị onye kwuo uche ya. Nke a mere na otu patị niile nwere ikike ịbịa chụọ achụmnta vootu na Anambra Steeti na-enweghị nsogbu ọbụla".