Etu Chineke siri nye m ejima ise ka m chechara afọ itoolu - Chidinma Amaechi

Aha onyonyo, Chidinma Amaechi: Etu Chineke siri nye m ejima ise ka m chechara afọ itoolu

Akụkọ ọṅụ a dapụtara n'ọha na nso nso dịka Chidimma Amaechi bụ nwaanyị ihe a mere na ndụ ya kọọrọ BBC Igbo ihe ọ gabigara tupu ọ mụta ụmụ ejima ise ya.

N'okwu ya, ọ kọwara na amụghị nwa bụ ihe na-adịghị mfe ma kwuo na ọ ju ndidi chere ma rịọ Chi ya ka ya nweta ụmụ.

Ọ kọwara na okwukwe ya mere o wetaghi na ọ bụ naanị otu nwa nọ ya n'afọ mgbe a chọpụtara na ọ dị ime.

Ọ gara n'ihu kwuo na ekpere ndị ọ kpere bụ ịmụ ejima nke mere mgbe dọkịta mechara mee nyocha n'afọ ya ma hụ ejima ise, ọ bịaghi ka ihe ịtụ n'anya nye ya.

Nwaanyị mụrụ ejima ise ka o chechara afọ itoolu

Ebe foto si, Chidinma Amaechi

Nwaada Amaechi kesara ozi ọma ihe mere na ndụ ya na soshal midia ma were ya gbaa ọha ume na ndidi ka mma.

Akụkọ ụgha ụfọdụ dapụtara oge akụkọ a pụtara nke gụnyere; na ndị mmadụ kwuru na ọ mụrụ ejima ise ndị a n'usoro ịmụta ụmụ a kpọro In vitro fertilisation (IVF). Ọ zọkwa bụ na ndị na gọọmentị nyere ya na di ya ọkpụrụkpụ ego.

Mana Chidinma kwuru na akụkọ ndị ahụ bụ asị ọcha na o nweghi IVF ọbụla o mere kama na ọ bụ Chineke nyere ya ụmụejima ise.