Ụlọikpe enyela DSS iwu ka ha kwụọ ọkaiwu Nnamdi Kanu N5m maka mmekpaahụ

Ebe foto si, Maxwell Opara/Facebook
Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja enyela mkpebi ka ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ Department of State Services (DSS) kwụọ otu n'ime ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu nde Naira ise maka ịkagbu ya.
Jọstis Zainab B. Abubakar, onye nyere ya bụ mkpebi ụbọchị Monde (4/4/2022), kwuru na DSS dara iwu ikike dịrị onye megide ọkaiwu Opara, ma nyekwa iwu ka DSS rịọ ya mgbaghara n'ọha site na itinye ya bụ ozi n'akwụkwọ akụkọ.
Cheta n'abalị 30nke ọnwa Ọgụstụ afọ 2021, ndị ọrụ DSS kpagburu ọkaiwu Maxwell Opara Chibuike dịka ọkaiwu juru na ọ foro nwanta ihe ka ha gbaa ya ọtọọ mgbe ọ gara ileta Nnamdi Kanu na mkpọrọ ndị DSS.

Ebe foto si, Maxwell Opara
E jichiri Kanu na mkpọrọ ndị DSS kemgbe Juun afọ 2021 maka ebubo iyindu egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.
N'akwụkwọ Opara gbara n'abalị isii nke ọnwa Septemba afọ 2021 nke akara ya bụ FHC/ABJ/CS/1018/2021, chọrọ ka ụlọikpe inye DSS iwu ka ha kwụọ ya nde naira iri ise maka ịkagbu ya megide ikike dịrị ya dịka mmadụ.
Akwụkwọ ahụ kwuru na "...ndị DSS tinyere ya n'otu ọnụụlọ maka inyocha ahụ, gbapụ ya mgbanukwu,ugegbe anya, ọla agbamakwụkwọ ya, uwe mgbuchi ahụ nakwa akpụkpọụkwụ ya n'ike ma menye ya ihere site ime ya ka ọ chịị traụza ya n'aka, gbara slịpas e dowere maka ndị nga ma tọọ nntuoyi awa atọ."
Onye bụdị Maxwell Opara

Ebe foto si, Maxwell Opara/Facebook
- Ọkaiwu Maxwell Chibuike Opara so n'otu ndị ọkaiwu na-anọchite Nonye ndu otu ipob bụ Nnamdi Kanu n'ụlọikpe
- Nwa amadi ahụ na-agba mbọ maka ikike dịrị onye bụ onye Ahiazu Mbaise dị n'Imo steeti





