Kedụ ihe ị ma maka ọrịa a kpọrọ 'Monkey Pox'?

Monkey Pox

Ebe foto si, Getty Images

Dịka enyochapụtara nje "Monkey Pox" n'ime ahụ otu onye Naijiria gara njem na mpaghara Texas nọ na mba Amerịka, dọkịnta Chikwe Ihekweazu bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa Bekee Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) kwuru n'ụbọchị Tozde na enyochapụtala ọrịa n'ezi a n'ahu mmadụ iri na ise na Naijiria ugbua.

Ozi ya kwukwara na ha na-enyocha mmadụ iri ise na itolu ọzọ a na-eche nwere ike ibu ya bụ ọrịa.

Mba Amerịka n'onwe ha ebidola ịchọ ihe karịrị mmadụ narị abụọ ndị ha si na ha na onye butere ọrịa monkeypox nwere mmekọ.

Ọ gịnị bụ ọrịa 'Monkey Pox'?

Ọrịa a bụ ọrịa nje nke yiri orịa "Small Pox".

Nke na-ebute ọkọ yiri ọkọ kịtịkpa n'elu ahụ mmadụ.

E nyochapụtara ọrịa a na mbụ n'ime ahụ enwe abụọ ndị okachamara sayensị nwuchiri n'ime ọhịa iji mee nnyocha na afọ 1958.

N'afọ 1970, e nyochapụtara ọrịa a n'ime ahụ mmadu na mba Congo.

Kemgbe afọ 1970, achọpụtala mmadu ole ma ole bu ọrịa n'obodo ole ma ole nọ n'Afirika nke gụnyere Naijirịa.

Njirimara na mgba ama ọrịa 'Monkey Pox'

Ọrịa a nwere ike igosi njirimara dị iche iche n'ahụ mmadụ, mgba ama ọrịa a kachasi apụta ihe n'ahụ onye bu ọrịa bụ:

  • Ahụ Ọkụ
  • Isi ọwụwa
  • Ahụ mgbu na azu mgbu
  • Oyi
  • Ike ọgwụgwụ

Mgbe mmadụ butere ọrịa a ruo ụbọchị atọ, ọkọ ahụ n'ebido fesawa n'elụ ahụ bido n'ihu ya ma fesawa ahụ ya niile, nke a n'eso oke ahụ ọkụ

Etu ọrịa sị efesa:

Dịka ọrịa a bụ ọrịa na-efe efe, mmadụ na anụmanụ maọbụ onye bu ọrịa a mekụta ahụ onye ahụ nwere ike ibute ya bụ ọrịa.

"Monkey Pox" na-efesasikwa ma mmadụ metụ aka n'elụ ebe nje ọrịa nọ dịka elu tebulu, elu akwa, aka ọnụ ụzọ nakwa ebe ndị ọzọ.

Nje a na-abanye n'ime ahụ mmadu site n'ebe mmadụ mereru ahụ, maọbụ site na ikụ ụme, maọbụ site na mmadụ imetu aka ọ kwọghị akwọ n'anya, n'imi maọbụ n'ọnụ.

Ọrịa a nwekwara ike isi n'ime ahụ anụmanụ banye n'ahụ mmadụ ma ya bụ anụmanụ taa mmadụ maọbụ gọọ ya mbọ.

Amabeghi anụmanụ na-ebughari ọrịa kachasia mana nnyocha na-egosi na oke nwere ike bụ anụmanụ kachasi ebu nakwa na-efesa ọrịa a.

Usoro mgbochi ọrịa "Monkey Pox"

  • Zere imetu anụmanụ aka, ọkachasị ndị arụ na-aya, nakwa ndị nwụrụ n'ike
  • Zere akwa, n'ebe ndị ọzọ anụmanụ metụtara
  • Hụ na ndị bu ọrịa a maọbụ a na-enyocha na ha bu ọrịa nọrọ ọnwe ha
  • Nwere mmiri na ncha n'akwụ aka gị kwa mgbe kwa mgbe, ọ kachasi mgbe imetụrụ anụmanụ ọbụla aka
  • Nwere akụrụngwa ndị ụlọ ọrụ ahuike chekwawa onwe gị dịka ihe mkpụchị imi, uwe aka, nakwa ihe nchekwa ndị ọzọ.

Ọgwụgwọ ọrịa "Monkey Pox"

Ndị ụlọọrụ sayensị nakwa ndị ụlọọrụ ahụike ekwuola na ha achọpụtabeghi ọgwụgwọ ọrịa a, mana a na-eji ọgwụ mgbochi "Small Pox" ebelata ike ọrịa a n'ahụ mmadụ.

Ọrịa a anaghi egbu egbu nke ukwu mana ọ ka mma mmadụ ichekwa ọnwe ya ma zere ya bụ ọrịa site n'usoro ndị ụlọ ọrụ ahụike depụtara.