Aba Bye-election Results: Chimaobi Ebisike nke PDP emeriela na ntuliaka ahụ

Ebe foto si, John Okiyi Kalu/Facebook
Ụlọọrụ Inec akpọpụtala Chimobi Ebisike nke PDP dịka onye meriri na ntuliaka onye ga-anọchiteanya Aba North na South n'ụlọomeiwu nta e mere na 27 Maachị, 2021.
Ọkammụta Fidelis Okpata nke Mahadum Ndufu Alike dị n'Ebonyi Steetị bụ onye ọrụ Inec kpọpụtara mpụtara ntuliaka ahụ.
Na mkpọpụta mpụtara ntuliaka aka ahụ, sị na Ebisike ji vootu dị 10,322 ebe Mascort Uzor Kalu nke APC na-eso ya nwetere vootu 3,674.
Destiny Nwagwu nke APGA ji 1,554, Okey Prestige nke AAC nwetere vootu 199 ebe pati APM na NRM ji vootu 10 na 13 n'usoro.
PDP na APC na-arụrịta onwe ha aka n'ọnụ maka ebubo nụrụaka

Otu pati abụọ nọ n'isi ntuliaka na Aba Nọt na Saụt amalitela ịrụ onwe ha aka n'ọnụ maka ebubo nụrụrụaka ha sị na-eme na ya bụ ntuilaka.
Ebe ndị otu APC na-eti mkpụ na a tọọrọ otu onye otu ha, PDP na ebo na ha hụrụ ka ndị otu APC ji ego egoko vootu ndị mmadụ na-enye ndị otu ha.
O nwebeghị onye ma nke bụ eziokwu ka ọ dị ugbua.

Amalitela ntuliaka iji họpụta onye ga-anọchite mpaghara Aba Nọt na Sawụt n'ụlo omeiwu nke nta n'Abuja dịka ọnwụ Ossy Prestige, bụ nọchiteburu mpaghara ahụ mere ha enweghị onye nnọchite anya.
Pati isii so azọ ọkwa a bụ Action Alliance (AA), All Progressive Congress (APC), All progressive Grand Alliance (APGA), People Democratic Party (PDP), National Rescue Movement (NRM) nakwa Alliance Peoples Movement (APM).
Ntuliaka a malitere n'elekere asatọ n'ọkara n'ụfọdụ mpaghara Imo Not na Sawụt a.

Mana onye ntaakụko BBC kwuru na ndị mmadụ apụtaghi ọfụma na ntuliaka .
N'Abia Polytechnic nke bụ ọdọ vootu Eziama wọdụ mbụ n'okpuru ọchịchị Aba Nọt ka o ji ọkara gaa elekere asatọ nke ụtụtụ ntuliaka malitere.
Ka ọdi ntuliaka na aga nke ọma , mana ndi mmadụ apụtaghi n'uju.
Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndi mmadụ tụmadi ndi ntorobịa jụrụ ibianye aka, n'ekwu na-aga a chọrọ ha ego tupu ha ana abianye aka.
Ngwongwo eji eme ntuliaka biachara n'oge n'ọtụtụ mpaghara e mere ntuliaka.

Akụkọ anyi nwetara na-akọta kepukepu tikapụrụ n'ikuku na onye ji aha otu party AA na nke APGA achilele aka elu, ka onye nke PDP gawa, kwuo na ya bụ okwu bụ okpokpo asị.Enweghi gbalụgbalụ ọbụla dị na ntuliaka a, sọsọ na Ụmụọla ka enwetara akụkọ na ụfọdụ ndi ntoroọbia anya na acha ọkụ chọrọ imaburu igbe ntuliaka mana arinze ndi uweoji bụ ndi zọchiri ha imejuputa mpampa ahụ.



Lee aha ndị a dịka ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ebe a:
AA Longinus CoE Prestige
APC Mascort Uzor Kalu
APGA Nwagwu Akaraka Destiny
APM Abraham Junior Okogbua
NRM Uwandu Emmanuel Chima
PDP Chimaobi Iheanyichukwu
Kamgbe INEC wepụtara aha ndia tozuruoke iso zọ ya bụ ọkwa ọchichi enwela egbe ọnụ, mmaja, na okwu di iche iche maka onye ya bụ ọkwa ruoro.
Ebe Orji Kalu siri naya n'okwu ntuliaka

Dika ụfọdụ na akọtọ onye senator na anọchite anya ọgbanta vote Aba north n'ụlọ nzukọ omeiwu Sineti na ọ na-akwanyere ndị Aba Nọt and Sawụt nwanne ya nwoke bụ Mascort Uzor Kalu ji ọkọrọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC azọ ya bụ ọkwa ọchichi, ebe ufọdụ na-eweliri ya aka.
Ụfọdụ, jụrụkwara ihe mere nwanne ya ga-eji hapụ ama nna ya bụ Bende bịa ịzọ ọkwa ọchịchị n'Aba.
Na mkparitaụka ụlọọrụ BBC na onye isioche (APC) na Abia state bụ Donatus Nwankpa nwere, ọ katọrọ ya bụ okwu, jụọ na onwere ebe akwụkwọ iwu ala anyị megidere nwanne onye nọ na ọkwa ọchichi izọ ọkwa ọchichi ọzọ ma ọbụrụ na orozuru oke.
Ka ọ dị, o mekwere ka amata na ọ bụ sọsọ Mascot Kalu bụ onye so zọbuo oche ahụ na afọ 2019 n'agbanyeghi na o nwetaghi ya zo azọ ya ugbua.
Nwamkpa kwuru n'akwụkwọ iwu ala anyị kwadoro mmadụ ịzọ ọkwa ọchịchị na mpagara ọbụla ochọrọ ịno.
Gbanye na Mascot anọla nnukwurunnu afọ na aba nke mere ojiri tuzuo oke maa ụma iso kwa ngu ọchịchị ahụ.
Longinus Prestige, nwanne Ossy Prestige, ji aha otu party AA azọ ya bụ oche, bukwanụ nke ahụtara ma ọbụ iwu na onye ọdachi wepụrụ nwanne ya n'oche, nwanne ya anọchie.
N'otu aka ahụkwa ụfọdụ na ekwu ka ahapụ APGA ka ọga n'ihi na Prestige nwụrụ anwụ nọ na otu party APGA ebe ụfọdi olooo.
Echi bụ Satọde abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Maachị ka ọgụa ga-ebe.
Ka ọdi ugbua aka na achị Abia State bụ Okezie Ikpeazu amachiela ngagharị ndị mmadụ na obodo niile nọ n'okpuru ọchịchị Aba south na North bido n'elekere asatọ nke abali taa bụ Friday abalị iri na ise nke ọnwa march ruo elekere isi nke ụtụtụ Sọnde bụ abali ịri na itogholu nke ọnwa Maachị afọ a.
Ozi a nke onye Kọmishọna mgbasa ozi n'Abia, John Okiyi Kalu bianyere aka, kwuru na atụwara anya na ọ bụ sọso ndị na-abianye aka, ndị ọrụ Inec tinyekwara ndi ọzọ ọrụ ha di oke mkpa ji ihe nkọwa onwe doro anya ka iwua na ejighi.











