Ugo Ugochukwu: Ihe i kwesiri ima gbasara nwa Oluchi Onweagba-Orlandi

Ugo Ugochukwu, nwa Oluchi na di ya bụ Luca Orlandi

Ebe foto si, Getty/Instagram

Nkọwa foto, Ugo Ugochukwu, nwa Oluchi na di ya bụ Luca Orlandi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ugo Ugochukwu bụ nwa onye ngosi(model) a ma ama bụ Oluchi Onweagba-Orlandi na di ya bụ Luca Orlandi.

Ọ bụ nwadịala malitere ịnya ụgbọala ọsọ n'ezigbo oge.

Ugo gbara sọsọ afọ iri na atọ abụrụla otu nwatakịrị n'ewu ewu ugbu a dika ụlọọrụ 'McLaren Racing' zụrụla yi ka onye ga na-agbara ha ọsọ ụgbọala.

Ugo Ugochukwu

Ebe foto si, @ugougochukwu

Ugo nwetala nturugo mmeri na mba Amerika nakwa Europe site n'ima aka asọmụmpi FIA OKJ European Championship e mere n'afọ 2020.

Kedụ afọ mụrụ ugo a?

Luca Orlandi,Ugo na Oluchi Onweagba

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Luca Orlandi,Ugo oge ọ dị obere na Oluchi Onweagba

Nne ya Oluchi Onweagba bụ nwada Igbo mba ụwa ji eme ọnụ dika ọ chakere site na ime ihe onyonyo iga ije nganga 'modelling' bido mgbe ọ gbara afọ iri na isii.

Oluchi na-ere ahia mbugari na Leg os tupu akara aka ya chakee ka o sonyere n'asompi 'Nokia Face of Africa' n'afọ 1998 ebe o meriri were site ebe ahụ bụrụ onye a ma ama n'ụwa dum.

Di ya bụ Luca Orlandi bụ onye o zutere n'ọrụ ya bụ onye Italị a ma ama n'ọrụ ịdụ akwa ndị nwere agba, bụ ọrụ e jirila mara ezinaụlọ ha agbụrụ kwuru agbụrụ.

Ọ bụ ya nwe ụlọrụ na-adụ akwa azụrụ eyiri ụmụnwaanyị a kpọrọ Luca Luca' nke ọ malitere n'afọ 1991.

Nne ya bụ Oluchi kele Chukwu n'ụzọ pụrụ iche n'ihi isiọma nwa ya nwetara ste n'aka ụlọọrụ "Mclaren Racing':

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị ha: