MyMTNApp: Enweela nkwekọrịta itinye akụkọ BBC n'ime ya
BBC na MTN nke Naịjirịa amalitela mmekọ ga-enye ndị nwere akara ekwentị MTN ohere ịnụ akụkọ ụwa si na BBC n'otu nkeji.
Akụkọ ụwa ga-eru ndị mmadụ aka n'efu ma dịrị n'asụsụ Igbo, Awụsa, Pidgin nakwa Yoruba.
Ihe a bụ mbụ ụlọ ntaakụkọ gazuru ofesi ga-apụta n'ogige akụrụmgwa akpọrọ MyMTN.

Ebe foto si, MTN
BBC Minute bụ atụmatụ ịkọ akụkọ dị mkpa n'ime otu nkeji, nke BBC ji eme ka ndị na-ege ha nọ ebe dị iche iche mara ihe na-eme.
Nkeji BBC a na-enwe akụkọ na-ewu na soshal midia na akụkọ na-eme n'ụwa dum ma na-agbanwekwa ya ugboro ugboro n'otu ụbọchị.
Atụmatụ a bụ maka ndị nọ na Naịjirịa.
Ọ ga-erere ndị Awụsa, Igbo, Pidgin na ndị Yoruba chọrọ akụkọ na nkenke, ma wetere ndị Naịjirịa chọrọ akụkọ BBC na nkeji n'ekwentị ha.
Dịka akụkọ ụgha na-abawanye n'ogige ntaakụkọ Naịjirịa nakwa Afrịka, nkwekọrịta a ga-enye ndị nwere akara ekwentị MTN ohere inwete akụkọ kwụ ọtọ n'aka BBC.
MTN bụ ụlọọrụ mgbasozi ekwentị kachasị n'Afrịka, nke na-enyere ihe karịrị mmadụ nde 64 aka inwe mmekọrịta dị iche iche site n'ekwentị ha.
myMTN nwere ihe karịrị mmadụ nde anọ na-abata ya kwa ọnwa.
Oluwatoyosi Ogunseye, bụ onyeisi BBC n'Ọdịdị-Anyanwụ Afrịka sị:
"Nkwekọrịta anyị na MTN na-eme gosiri etu BBC si na-agba mbọ iru ọha na-ege ntị ebe ọbụla ha nọ. Anyị na-enwekwa aṅụrị maka ohere anyị na ndị ntoroọbịa na Naịjirịa nwere inwe mmekọrịta."
Onye ọzọ kwuru okwu bụ onye ji ọkwa Bekee kpọrọ "Chief Digital Officer" na MTN Naịjirịa bụ Srinivas Rao.
Ọ sị "Nkwekọrịta a masiri anyị nke ukwuu. Ọ bụ otu ụzọ anyị si enye ntoroọbịa Naịjirịa ohere inwete ozi nwere isi. N'oge ugbua akụkọ ụgha na-agbasa aghara aghara site na soshal midia, ọba dịka nke a ga-abụ ihe ọpụrụiche."
Kolawole Oyeyemi, bụ onye ji ọkwa Bekee kpọrọ "General Manager, Customer Experience", na MTN sị: "Ọ ga-egosikwa mmasị anyị n'inye ndị na-azụ anyị ahịa ihe ọkamma site na myMTNApp. Ha ga-esi ebe a nwete akụkọ eziokwu n'efu."

Ebe foto si, MTN
Mary Lusiba, ji ọkwa Bekee kpọrọ "Head of African Business Development na BBC World sị:
"Ọmarịcha nkwekọrịta a ga-eme ka ndị mmadụ mata maka anyị na ihe anyị na-eme, ọkachasị ndị ntoroọbịa. Ọ ga-esonye aha ọma BBC nwere n'inye akụkọ ọpụrụiche were ruo ndị ntoroọbịa ọhụrụ. Nkwekọrịta a ga-enye aka gbasaa ozi banyere ọrịa covid-19 n'Afrịka."













