Food Preservation: Ma i nwere ọkụ ma i nweghi ọkụ, lekwa etu ị ga-esi chekwa ụfọdụ akwụkwọ nri gị

Ose

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chimezie UcheAgbo
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

E nwere ụzọ dị icheiche e ji echekwa nri nke ndị nne na nna ochie kuziere anyị.

Etu ahụ ka ha si chekwa nri tupu igwe nju oyi apụta.

Agbanyeghi na ha na-akpata akwụkwọ nri richapụ ya ozugbo, ha na-enwekwa ụfọdụ oge ha na-edebe ya bụ akwụkwọ nri abalị ole na ole tupu ha esie ya.

Mana n'oge ọgbara ọhụrụ a, ichekwa nri bụzị naanị n'igwe njuoyi mana kedukwanụ maka onye na-enweghi igwe njụoyi?

Maọbụ na igwe gị ezughiri gị maọbụkwanụ na ndị na-enye ọkụ mere etu ha si eme, ọkụ adịrọ, gịnị ka ị ga-eme?

BBC Igbo gbara otu onye oshite aha ya bụ Wisdom Isu ajụjụọnụ, o kwuru na ọ rara ahụ ichekwa nri maọbụrụ na ọkụ adịghị mana ọ pụtaghị na a na-emeli ya.

Ọ kọwara na nri niile nwere ụzọ dị icheiche e si ahazi ha ga-eme ka ha nọtee aka. Mana onye ọbụla chọrọ ichekwa nri ga-ebu ụzọ ihe abụọ n'uche; oge ole ị chọrọ ka ọ nọrọ nakwa ihe ndị ị chọrọ iji ya mee, ịmaatụ bụ akwụkwọ nri na mkpụrụosisi.

Isu kwuru na o nwere ụfọdụ nri i nwereike idobe n'onwe ma ị hazie ya nke ọma, ha anọọ ọtutụ izuụka mana ụfọdụ nri agaghị anọte aka etu ahụ.

O kwuru na ndị nne anyị nwekwara ụzọ ha si eme ihe ndị a n'oge gboo ya ka ji aga ma rue taa.

Ihe ndị Igbo ji echekwa nri

Nkata: O nweghi ụlọ Igbo ị ga-aga oge gboo ka ị ghara ịhụ nkata n'ụdị dị icheiche, nke basara abasa, nke kpokoro ọnụ, nke ukwu, nke ntakịrị ụdị nkata a na-akpa karịrị akarị. Nke a bụ maka na ihe e ji ya eme karịkwara akarị.

E ji nkata dị icheiche awunye ihe dị iche, nkata ị ga-eji gbasaa akwụ abụghị nkata ị ga-eji gbasaa akịdị.

Nkata

Akpa aji: Nke a bụ akpa nwere ohere ikuku nwereike ịba n'ime ya. Akpa ndị ka a ga-etinye nri n'ime ya, ohere adịkwa ebe ọ ga-esi na-enweta ikuku ga-eme ka ọ ghara ire ure.

Ikuku: Ikuku bụ otu akụrungwa dị ezigbo mkpa iji chekwaa nri. Onye ọkachamara n'okwu nrị aha ya bụ Dọkịnta Chinasa Amadi gwara BBC Igbo na mmiri bụ onye iro na nchekwa nri ebe ikuku bụ ezigbo enyi nchekwa nri.

Anwụ: Anwụ ka ndị Igbo ji echekwa nri n'oge gboo. Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na anwụ na-amịkpọ ihe niile nri na-enye n'ahụ mana dọkịnta Chinasa Amadi kwuru na nke a abụghị eziokwu. O kwuru na ịgbasa ihe n'anwụ maọbụ ịkpọ ya n'ime ụlo enweghi ihe ọbụla ọ na-eme nri ahụ.

Lee etu ị ga-esi chekwa nri ndị a:

Tomato: Ọ bụrụ na ị chọrọ ka tomato gị nọọ otu izuụka, ị ga-agba mbọ zụta ndị siri ike na-emetọbeghi emetọ. Ọ bụrụ na o nwela nke metọrọ na ya, i wepụta ya n'etiti ndị ọzọ wụsaa ya na nkata dobe ya n'ebe juru oyi ikuku ga na-emesa ya.

Tomato

Ebe foto si, Getty Images

Ihe o ji dị mkpa iwepụ nke ọbụla mebiri bụ maka na ọ ga-esi n'otu ahụ fesaa na ndị ọzọ, nke a bụ dịka nwada Wisdom Isu siri kwuo.

N'okwu ya, Isu sịrị: 'Ọ bụrụhala na o nweghi nke mebiri dị n'ime ya tupu ị gbasa ya, ọ gaghị emebi, ruo ihe dịka abalị asaa kama o nwereike ịmalite ịfịkpọ n'ahụ ya mana ime ya ka nwekwara mmiri dị mma.' Ọ bụrụ na i nweghi nkata, gbasa ya ebe ikuku ga na-emetụ ya ma mmiri agaghị emesa ya.

Akwụkwọ ụgụ: Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụgụ gị nọtụ abalị ole na ole, gbaa mbọ hụ na i mesaghị ya mmiri ma ị kpata ya maọbụ ị zụta ya n'ahịa. Mmiri mesa ya, ọ ga-amalite ire ure mana ọ bụrụ na mmiri emesaghị ya, ọ ga-anọ na nkata n'ihe abalị abụọ mana i jiri akwụkwọ kechie ya tinye ya, ọ ga-anọ abalị atọ.

Aha onyonyo, Uru dị n'akwụkwọ nri

Gbakwa mbọ hụ na ọ na-anata ikuku ebe i dobere ya. Ọ bụrụ na i bela ụgụ ahụ ebe, otu ihe ahụ bu gbaa mbọ hụ na mmiri emetụghị ya ebe i dobere ya, wụsaa ya na nkata mee ka ikuku na-eru ya. Etu a ọ ga-anọ ihe ruru abalị ise ma o mebighi emebi.

Akwụkwọ ọha: Agbanyeghi na ọha dị ezi peke peke, i kechie ya n'akwụkwọ unere, ọ ga-anọte aka tupu i sie ya. Mmiri emetụkwala ya ma hụụ na ọ na-enweta ikuku.

oha

Ọkwụrụ - Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọkwụrụ gị ghara imebi, ekwekwala ka mmiri mesa ya, gbasaa ya na nkata maọbụ n'akụkụ mpio ebe ikuku ga-enweta ya.

Mgbọlọdị - Mgbọlọdị na-ara ahụ maka ọ bụ akwụkwọ mmiri n'onwe ya mana i nwereike idobe a abalị atọ tupu o mebie. I were akpa ajị maọbụ akpa osikapa, wunye ya n'ime ya, akpachala ya akpacha, wunye ya na osisi ya n'ime akpa ahụ ma jiri nwayọọ gwube ya ka ngwugwu. Etu a, ọ ga-anọli abalị atọ maọbụ anọ.

Unere - I nweta unere chara acha, ị chọghị ka o mebie, dọkịnta Amadi kwuru ka i were akpa wakịrịwakịrị kechie isi ya ebe e si adọpụta ya. Etu ahụ ọ ga-anọ rue mgbe i richara ya.

Banana

Ebe foto si, Getty Images

Ogede - Otu ihe ahụ i mere unere ka ị ga-eme ogede. Kechie isi ebe e si ewepụta ya, jiri nwayọọ nwayọọ na-ewepụta ya. Ị chọrọ ka ọ chaa, i tinye ya n'ime akpa wakịrịwakịrị ka ọsịsọ mee ya, ọ chaa ozugbo.

Yabasi - Gbaa mbọ hụ na ị wepụrụ nke ọbụla dere ede n'ime ha ma gbasaa ya na nkata etu a. Ọ ga-anọli otu ahụ ọnwa kwụrụ ọnwa.

Ose: Gbasaa ose na nkata mabụ n'ala ebe ọ na-enweta ikuku.

Ose

Ebe foto si, Getty Images

Pọpọ - Ọ na-emetọ ọsịsọ ma ọ chaa achaa. Pọpọ chọrọ ebe dị ezi jụụ maka mkpọmọkụ ọbụla ga-eme ya o dee. Ị ga na-atụgharịkwa ya kwamgbe kwamgbe ka ahụ ebe dị n'ala ghara imebi.

Ọ dị mkpa ịmata na ụfọdụ nri na-anọ ọdụ karịa ụfọdụ. Ị ga-ebu nke a n'uche oge niile.