Harmattan: Etu ị ga-esi zọọ ndụ gị oge ụgụrụ a

Ụgụrụ

Oge ọkọchị ọkachasị mgbe ụgụrụ dị bụ oge ụfọdụ nje na ọrịa dị iche iche na abụta ihe.

Oge ụgụrụ na ebidokarị site n'ọnwa Nọvemba rụọ nke Machị.

Ụgụrụ na-ebu oke uzuzu,oyi na ahụ ikpo nkụ.

Otutu ndị mmadụ na-eji ụzọ di iche iche echekwa ọnwe ha mgbe ụgụrụ mana ụfọdụ ụzo ndịa ezighi ezi.

Dọkinta na-ahu maka anụ ahụ na ahu ike bụ Chidinma Okafor kọwara etu ị ga-esi chekwa onwe gị n'oge ụgụrụ.

Ihe na eso ụgụrụ abịa

Chidinma Okafor kọwara na ụgụru bu oge ikuku na-ebu nje ọrịa dị iche iche efegharị.

O kwukwara sị na 'ụgụrụ na-ebute kwa oyi na ahụ ịkpọ nkụ maka na ụgụrụ na amịkpo mmiri di n'anụ ahụ'.

Ahụ ịkpọ nkụ a na emezi ka obere ihe bute ọnya n'ahụ.

Kedu ọrịa na-eso ụgụrụ?

Ụfodụ nje dịka Diahorrea anaghị adịkarị oge ụgụrụ.

Nje na ebute ụkwara nta

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nje na ebute ụkwara nta

Ya bu na ọrịa a na-ebute na mmiri anaghị adịkarị.

Kama ọrịa dịka ụkwara nta (tuberclosis) na enye nsogbu oge ụgụrụ.

Etu ị ga-esi chekwa onwe gị n'oge ụgụrụ.

Ụlọ obibi ọbụla kwesiri inwe ebe ikuku si apụ na ebe ikuku si abata (Cross ventilation).

Wịndo ụlọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Oge ụgụrụ ọ dị mkpa ka ikuku na abata ma na-apụ maka nchekwa ahuike

Nke a ga-egbochi ọrịa dịka ụkwara nta ịwakpo ndi bi ebe ahu.

Ọ dị mma ịṅụ mmrir oge ụgụrụ ma na aṅụ ya ọfụma.

mmiri ọṅụṅụ
Nkọwa foto, Ịnụ mmiri na-adị mkpa oge ụgụrụ

Nkea bụ maka na ikuku ụgụrụ na amịkpọcha mmiri dị na-ahu mmadụ

Ude nke na eme ka mmiri dị n'anụ ahu mmadu na adị mma (Moisturizer)

Mmanụ a na-ete n'ahụ
Nkọwa foto, Mmanụ a na-ete n'ahụ dị nma ichekwa ahụ oge ụgụrụ

Ude mmanụ dị na ya na enyere kwa ezigbo aka n'ihi na mmanụ dịka nrị anu ahụ.

Mkpụrụ osisi na akwụkwọ nrị na-enyere aka ọge ụgụrụ.

Kukumba
Nkọwa foto, Nri dịka kukumba na-adị mma n'oge ụgụrụ

Ụmụ ihe dịka agwa, osikapa na adị kwa mma oge ụgụrụ

Mkpụrụ akwụkwọ nrị dịka Kukumba na adị mma oge ụgụrụ.

Akupe igwe na enyerekwa aka ibusasi nje oge ọkọchi.

Igwe ntụoyi na-akpọnwụ kwa ahụ mgbe oge ụgụrụ.

Nwatakịrị ekpuchiri maka oyi
Nkọwa foto, Ekwesiri ikpuchi ụmụaka ahụ oge ụgụrụ

Ndị nwere ụmụaka ka-ekpuchi ha ahụ ọfụma maka oyi ma ọ bụ nje ndị a.