Omoyele Sowore: DSS sị anyị bịa n'ụtụtụ a - Femi Falana

Ebe foto si, Instagram/@yelesho
Ọkaiwu na-anọchite anya Omoyele Sowore bụ Femi Falana gara Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja gaa gwa Ọkaikpe na o mezuola ihe a sị ya mee iji tuzuo ịtọghapụ.
Cheta na ụlọikpe ahụ nọ n'ọnwa Ọktoba nye Sowore ohere ịla ma ọ kwụọ nde narị naịra ma kpọtakwa mmadụ abụọ ga-ejikwa ego ole ahụ gbaara ya akaebe.
Kemgbe ahụ, nwaamadị ahụ tọrọ na mkpọrọ maka na o nweghị onye ga-agbara ya akaebe.
Olileanya na a ga-atọghapụ Sowore ụnyaahụ bụ ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba, amịtaghị mkpụrụ.
Dịka ụlọ ntaakụkọ Premium Times siri dee, ndị Directorate of State Security (DSS) ekweghị ahapụ ya.
Ka ha sị dee, ihe DSS kwuru mere ha ji ka jide ya bụ makana ha emechiela ọrụ mgbe o si si ụlọikpe rute ha aka.
BBC Igbo kpọrọ Maazị Falana ịmata nke bụ eziokwu, o were sị na a sị ka ha laghachite n'elekere iri nke ụtụtụ a bụ abalị asaa nke ọnwa Nọvemba.
"Ndị ọrụ nọ n'ụlọ ọrụ DSS ụgbụa, kpọghachite m ma ọ kụọ elekere iri na otu nke ụtụtụ a."
Anyị na-eso akụkọ a.









