Ethiopian Airlines crash: Amina Nwanne m na-alọta ịbịa lụ di mgbe ọ nwụrụ

Nwanne otu nwaanyị nwụrụ na mkpọkasị ụgbọelu Ethiopian Airlines gwara BBC na nwanne ya ahụ na-akwado ịlụ di.
Amina Ibrahim Odowaa na nwa ya nwaanyị dị afọ ise so na ndị nwụrụ n'ọdachi ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O kwuru na ọnwụ ya ka bụ ihe ịtụanya diri ezinaụlọ ha nakwa di na-akwado ịlụ ya.
N'otu aka ahụ

Ebe foto si, Reuters
Ndị na-eme nyocha achọpụtala igbe ojii nke a kpọrọ 'black box' na Bekee si n'ụgbọelụ Ethiopian Airlines nke dara n'ụtụtụ ụbọchịụka.
Ihe ndị ha chọtara gụnyere igwe na agụkọ olu ndị mmadụ nakwa igwe na-agụkọ ihe niile mere n'ụgbọelu ahụ tupu ọ daa n'ike.
Cheta na ụgbọelu Ethiopian Airlines Boeing 737 bu ndị mmadụ ruru 150 si isiobodo Addis addis Ababa aga Nairobi dị na Kenya, kpọkasịrị n'obodo Bishoftu na enweghị onye zọtara isi ya.
N'Imo

Ndị uweojii anwụchiela Ezirim ThankGod Kelechi bụ onye chịkọtara mpụtara ntuliaka ndị okpuruọchịchị Ọhaji-Egbema ụbọchị Monde maka ịkpọpụta mpụtara na-adabaghị adaba dịka ọ manyere puku ole na ole na ọnụọgụgụ nke otu AA nwetara n'Imo steeti.

Ebe foto si, AFP
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ịgbochi ọrịa bụ Chikwe Ihekweazu ekwuola na ọnụọgụgụ ndị ọrịa Iba Lasa ji agbadaala n'izuụka ise gara aga.
Ọ gwakwara ndị ntaakụkọ na ndị nwụrụ site n'ọrịa ahụ agbadaala nke ukwu ma kwuo na ha ga-agba mbọ ịkwalite ọrụ ha na gburugburu Naịjirịa niile.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Onye ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Ogehnekaro Etebo alaghachiela na nkwado n'otu Stoke city dịka ahụ dịchara ya mma.
Cheta na o soghi otu ya mgbe ha zutere QPR n'ihi ahụ ọ merụrụ n'ụbọchị Satọde gara aga.








