Nigerian Police: E gburu ụmụaka abụọ ma tụnye ha n'ime igbe njụoyi

Igbe njụojii

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii ejichiela otu nwoke a kpọrọ Michael Ede bị n'Ikorodu dị na Lagos iji nyere ha aka n'ịchọpụta onye gburu ụmụ ya abụọ.

E nwetara ozu ụmụ abụọ ndị a dị afọ isii na afọ anọ n'ime igbe njụoyi dị n'ụlọ ya.

Dịka Ede onye gara mee mkpesa n'ogige ndị uweojii siri kọwa, ya na ụmụ ya kpochiri ụzọ laba ụra n'abalị, mana n'etiti abalị oge ọ gara ịnyụ mamiri, ọ hụzighị ụmụ ya.

Ọ chọwara ha ma hụ ozu ha n'ime igbe njuonyi.

N'okwu ya, onye na-ekwuchitere ndị uweojii na Lagos state bụ Chike Otih kwuru na ndị uweojii nwuchiri nwoke ahụ iji nyere ha aka ime nyocha banyere okwu a.

Akụkọ ga-amasị gị