CBN: Anyị ga-ada ụlọakụ enyechighaghị onye ha wepụrụ ego ya nha

Ebe foto si, Reuters
Ị ma na ụlọakụ ọbụla wepụrụ ego n'akpaego gị n' ATM maọbụ akwụmụgwọ ntabianya na enyeghị gị ya ozigbo ga-eri nha ma ha etichighaghị ya n'awa 24?
Ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ akpọrọ 'Central Bank of Naijiria' (CBN) na Bekee etiela iwu na ụlọakụ ọbụla akwụnyeghị n'ime awa 24 ego ọbụla n'aha onye nwe ya n'atụmatụ akwụmaụgwọ ozigbo ozigbo(Nigeria InstantPayment,NIP,) ga-aha nha puku Naira iri.
N'otu aka ahụ, CBN kwuru na ọbaego ọbụla etichighị ego n'akpa ego onye nwe ya na nkeji anọ, ha ga-akwụkwa nha puku naira iri.
'Iwu dịka o siri gbasa iji igwe intanet eziga ego na Naijiria' dị n 'ozi Dipo Fatokun, bụ onyeisi CBN n'ihe gbasara akwụmaụgwọ ụlọakụ binyere aka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Iwu ọhụrụ ahụ nke ga-ebiri ọkụ n'abalị abụọ nke ọnwa Oktoba, kwukwara n' oge ọbụla ụlọakụ zigara ego na abụghị dịka onye nwe ego siri chọọ n'ihi ndehie akara onye nwe ego, ụlọakụ ahụ nwere abalị 14 iji degara ụlọakụ ezigara ya bụ ego akwụkwọ, ebe nke ahụ nwekwara naanị otu ụbọchị iji zaahachi ya.
Ọ dị otu ahụ, ụlọakụ ahụ nwere naanị awa 24 izigara onye nwe ego ozi banyere ihe mere ego ya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:





