Onyeohi ọgbatumtum akụgbuola onwe ya

Ebe foto si, AFP
Onyeohi anatala ụgwọ dịrị ọrụ ya n'otu ntabi anya.
Otu onyeohi ji egbe dapụrụ n'elu ọgbatumtum ọ natara onye nwe ya n'ike oge o ji ya na-agba ọsọ ka ọ gbafuo.
Onyeohi ahụ nke mere dịka ya bụ onye chọrọ ịga njem, ji egbe nara onye nwe ọgbatumtum ihe ya n'Abule Ijaiye dị na Lafenwa na Abeokuta, Ogun steeti.
Akụkọ akwụkwọ Punch kọwara onyeohi ahụ naa onye nwe ọgbatumtum ahụ gbara mgba nke mere ka onye ohi ahụ gba ya egbe n'aka tupu ọ hapụrụ ya ọgbatumtum ya.
Mkpu o tiri mere ka ndị mmadụ nụrụ olu ya gbata ma chụwa onyeohi ahụ, nke dapụrụ n'ọgbatumtum ahụ kụọ isi na okwute, ma nwụọ ebe ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ọgun Steeti, Abimbola Oyeyemi, kwuru na ihe ha nwetara n'ahụ onye omekome ahụ gunyere egbe, mgbọ abụọ nakwa ọgbatumtum ahụ e zuru ezu.
N'otu aka ahụ, ndị uweojii nwụchikwara ndị ohi ọgbatumtum na ezute na Naịjirịa ga ree ya na Bene Ripọblik.




