Juventus na Lyon: Urata ekwoola n'isi Christiano Ronaldo na ndị Juventus

Ebe foto si, Getty Images
Christiano Ronaldo na ndị otu ya bụ Juventus aghọọla Erọn gbara aka laa n'asọmpi UEFA champions league nke afọ 2020.
Olympique Lyon nke mba Fransi dulara ha mmụọ n'abalị Fraide.
Juventus ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Lyon, mana o zughi iji bufee ha n'agba nke ọzọ.
Cheta na Lyon jibu otu ọkpụ goolu asataghi asata merie Juve oge ha abụọ zutere na Fransi.
Nke a pụtara na Lyon lafeere site na nke Bekee kpọrọ 'away goal rule'.
Ihe kpatara nke a bu na ha nyetere otu goolu na be Juve, mana Juve enyeteghi goolu ọbụla na be ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bu Ronaldo nyeteere Juve goolu abụọ n'abalị Fraide, ebe Memphis Depay nyere otu goolu nke ndị Lyon.


Manchester City gbara Real Madrid ụgbọ nwa mkpi sị ha kwakọrọ pụọ n'asọmpi Uefa Champions League.

Ebe foto si, Getty Images
Ha mere nke a site n'iji goolu abụọ asatara merie n'ụkwụ nke mbụ ma were goolu anọ asatara abụọ na ngụkọ sị sie Madrid ka ọ dị.
Ha malitere ibu nye madrid akpa njem ụla na nkeji 9' mgbe Raheem Sterling nyere goolu.
Mana Real Madrid jụrụ ịmaburu akpa a mgbe Kareem Benzima sara goolu ahụ na nkeji 28'.
Mgbe ha batara n'ọkara abụọ n'asọmpi a ka Gabriel Jesus siri ọnwụ nye Real Madrid goolu ọzọ na nkeji 68' nke mere ka olileanya ha agwụ.
Madrid siri ọnwụ ka dimkpa ha bụ mana Man. City fooro ntụtụ taa sị na Madrid ga-abarịrị n'ụgbọ nwa mkpị a.
Etu a ka ọ dị ruo mgbe ogbu pịpịrọ gbuchiri asọmpi ahụ.
Mmerie Man. City mere ka ha tozuoke n'ọkara ikpeazụ asọmpi Champions League nke afọ 2019/2020 ebe Real Madrid akwakọọrọla pụọ.










