Blac Chyna: Ị chọro ịcha ọcha ka Bekee?

Ebe foto si, Getty Images
Angela White aha otutu ya bụ Blac Chyna ga-abata Legọs na ngwụcha izu a ị bịa chụọ nta ego.
Blac Chyna kwuru nke a n'ọbaozi Instagram ya ebe ọ gbara ama ka ya na ndị ọrụ na-emepụta ude ọchakaọmaka eturu "Whitenicious" si ejiko aka n'ịrụpụta ya bụ ude.
Nwaada a gbara afọ iri atọ (30) bụ onye si n'ihe onyonyo "reality TV show" sepụta isi na-akpọkụ ndị nkwado ya dị nde 14.8 na Instagram ka ha soro ya bịa kpuhe ya bụ ude ọcha ka ọmaka akpọrọ Diamond Illuminating & Lightening cream na Legọs bụ isi obodo azụm ahịa Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Ndị mepụtara ude Whitenicious kwuru na-ọrụ ya bụ ịsacha akụkụ ahụ bụ ekwe ekwe dị ka azụaka, ikpere, nkoaka, ike ojiri na akụkụ ahụ ndị ọzọ bụ ekweekwe.
WHO ekwuola na Nigeria bụ ndị mbụ n'obodo ndị kacha ete ude ọcha ka ọmaka n'ụwa gbaa gburugburu.
Ihe nchọpụta WHO mere na-egosi na ụmụnwaanyị kwenyere na mma dị n'ọcha bụ nke na-eme ka nwaanyị lụọ dị nkwa nkwa.
Mana ndị ọkacha mara kwukwere na ude ọcha ka ọmaka na-emebị anụ ahụ bụ nke nwere ike ịbute ọrịa kansa.