#BloodontheFlag: Ndị ọrụ nkiri na Naịjirịa egosila obi mgbawa ha
Ndị ọrụ nkiri na Naịjirịa apụtala n'elu soshal midia igosi iwe ha gbasara etu ihe si aga na Naịjirịa, ọkachasị ogbugbu e gburu ndị mmadụ na Platu steeti.
Ọtụtụ ndị nkiri pụtara na Instagram na-eme ihe onyonyo na-egosi na ihe a nwereike ime onye ọbụla.
Ha ji akara #Bloodontheflag nke pụtara ọbara dị n'ọkọlọtọ Naịjirịa wee na-egosi na ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla.
Gụnyere ihe onyonyo ha mere, ha na-edepụtakwa etu ọ dị ha n'obi.
Nwata nwaanyị so na ihe nkiri Big Brother naija nke afọ 2018 bụ Ifu Ennada tinyere ọnụ n'okwu iwe ndị na-eme onyonyo na-egosipụa n'elu soshal midia etu ihe si aga na Naịjirịa.
Stan Nze dere; "Anyị ekpela ekpere, anyị ebeela akwa, anyị akwafuola ọbara ndị aka ha dị ọcha, ndị anyị hụrụ n'anya anwụọla ma na anyị na-ekwu na ozugo.
"O ruola oge anyị ga-eme ihe. O ruola oge anyị ga-ekwu okwu. Tinye olu gị taa."
Ọ bụghị naanị Stan Nze na-eme ngosi iwe a, ọtụtụ ndị ọzọ esonyekwala.
Onye bidoro ya bụ ngosi iwe aha ya bụ Niyi Akinmolayan gwara BBC na ya chọrọ izigara gọọmenti etiti ozi dị ọkpụrụkpu mere ya jiri bido ya bụ ngosi iwe.

Ebe foto si, Niyi
Niyi bụ onye na-ahazi ihe onyonyo kwuru na ya gwara ndị nọ n'ihe nkiri ibe ya ka ha gosi foto ha maọbụ ihe onyonyo ha ebe ha ji ihe yiri ọbara iji kwado ezinaụlọ mwakpo mere na Platu steeti metụtara.
Ọ gara n'ihu kuzie ndị mmadị etu ha ga-esi mee ya bụ ihe ga-eyite mmeru ahụ n'aka ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
BBC Igbo gbara mbọ inweta onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii bụ Jimoh moshood mana ọ zaghachighi ozi niile anyị zigara ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:












