Europa League Final: Arsenal na Chelsea ga-agwọ onwe ha ibi na Baku

Ebe foto si, Getty Images
Eden Hazard zara aha nna ya wee si n'ọnọdụ "gbaa ka anyị laa" wee kpọpụta ndị otu ya na ndagwurugwu ọnwụ.
Nke a pụtara na Chelsea na Arsenal ga-ezute onwe ha n'asọmpi ikpeazụ nke Europa League.
Roben Loftus-Cheek bu ụzọ gbanye otu ọkpụ na neeti Eintracht na nkeji 28.
Luka Jovic nke Eintracht sara ya ọkpụ ahụ na nkeji 49 n'agba nke abụọ.
Asọmpi ahụ lọkatara ka ofe ọkwụrụ were ruo oge ntinye ruru nkeji 30 tupu ọ banye na penariti.
Ross Barkley nke Chelsea bu ụzọ gbanye na neeti ndị Eintracht, tupu Haller asaa ya.
Caesar Azpilicueta gbanyere ọkpụ nke ya n'aka onye nche bọọlụ ebe Luka Jovic tinyere nke ya n'ime neeti kpọm kwem.
Ọzọ Jorginho na Jonathan de Guzman nwetere ọkpụ nke ha gbara.

Ebe foto si, Getty Images
Davide Zappacosta gbanyere nke ya ebe Kepa chewara ndị Frankfurt obi mgbe o ji ikpere ya kpado ọkpụ Hinteregger gbanyere.
N'ikpeazụ Eden Hazard gbanyere ọkpụ mmeri nke Gonçalo Paciencia asataghịnwu.
Arsenal mechiri akwụkwọ Valencia

Ebe foto si, Getty Images
Arsenal gwara Valencia na "ọ ga-adị mgbe ọzọ" dịka ha ji ọkpụ goolu anọ feere ha aka.
Pierre-Emerick Aubameyang ji ọkpụ goolu atọ gbanye Valencia ajụ n'anya na nkeji 17, 69 na 88.
Alexandre Lacazette nyeere ya aka gbanye otu ọkpụ na nkeji 50.
Nke a kpokọtara goolu niile otu abụọ a gbara ka ọ bụrụ 7-3 ka ha gbatara n'ụkwụ abụọ ha zutere.
Ndị Valencia kpakwara ike mere ka ndị mmadụ na-ajụ ma ha enwere olileanya dịka nke mere ndị Liverpool na ndị Tottenham n'asọmpi Champions League n'izu a.
Kevin Gameiro nke Valencia nwara ike ya site n'itibanye goolu abụọ chara acha na nkeji 11 na nkeji 58.










