EPL Results: Ọ dị ka Manchester United etetala n'ụra

Ndị Man Utd

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Manchester United ji goolu anọ merie Bournemouth n'ihe bụ mmeri nke ugboro atọ ha na-enweta kemgbe Ole Gunna Solskjaer malitere ịchịkọta ha.

Goolu abụọ Paul Pogba nyere na nkeji ise na nkeji 33, nke Marcus Rashford nyere na nkeji 45, na nke Romelu Lukaku gbakpuru na nkeji 72 nyere ha mmeri n'ihu ndị be ha.

E mechara gụfuo nke Eric Bailly gbakpuru na nkeji 79, tupu a chụpụ ya maka igbatu Ryan Fraser.

Goolu Nathan Ake nyerela ndị Bournemouth aka gbakpuo na nkeji abụọ a tụkwasịrị na nkeji 45 n'ọkara nke mbụ azọghị ha n'aka ndị Man Utd.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Manchester City ehichapụla ihere n'anya ha

Manchester City enweela ohere itu ọnụ site na mmeri ha meriri n'izu a na Premier League.

Ha gbara Southampton ọkpụ atọ asatara otu, nke bụ mmeri mbụ ha na-enweta ka Crystal Palace na Leicester City merichara ha n'ime izu abụọ gara aga.

Aguero ji isi takpuo bọọlụ

Ebe foto si, Getty Images

Goolu David Silva nyere na nkeji iri, nke kụrụ James Ward-Prowse bụ onye Southampton n'ahụ wee daba na mpio na nkeji 45 na nke Kun Sergio Aguero nyere na nkeji atọ a tụkwasịri na nkeji 45 nke ọkara nke mbụ zuru inye ha mmeri na-agụsi ha ike.

E mechara chụpụ Pierre-Emile Hojbjerg bụ onye nyerela Southampton goolu.

Obi aṅụrị kpara ha maka mmeri a ha ga-eji wee banye afọ ọhụrụ:

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Chelsea chakere ka ọnwa

Otu ọkpụ goolu Ngolo Kante nyerela Chelsea na nkeji 51, mere ka ha merie Crystal Palace, ma mee ka ha were pọịntị ise na-aga Arsenal na Premier League.

Nke a bụ goolu atọ nke Kante na-enyere Chelsea n'ime 2018.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Burnley ji ọkpụ goolu abụọ merie West Ham.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: