EPL Results: Manchester United ezuola Cardiff City ike n'ahụ

Ndị Man Utd

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọ bụ eziokwu na a na-agba bọolụ, e kwesịrị ibu n'obi na ụfọdụ oge ọ ga-abụ "ndị n'ọchị, ndị n'akwa", mana etu nke izu a si gaa enyeghị ọtụtụ ọnụ okwu.

Ihe a gbatara na Premier League n'ụbọchị Disemba 22, 2018, mere ndị Chelsea na Manchester City "vum n'anya".

Manchester United zuru Cardiff City ike n'ahụ:

Man Utd nyere goolu ise iji merie Cardiff City na be ndị Cardiff n'agbanyeghị na Victor Camarasa gbakpuru otu goolu ha si na penariti nweta.

Goolu Marcus Rashford nyere na nkeji atọ e ji bido bọọlụ, nke Ander Herrera nke Anthony Martial nyere na nkeji 41 na nke Jesse Lingard ji penariti gbakpuo na nkeji 57 nakwa nkeji 90, nyere Man Utd onyinye na-agụ ha n'ekeresimesi a.

Nke a bụ mmeri mbụ ha na-emeri ka Ole Gunnar Solskjaer bidoro ịchịkọta ha dịka onye ga-elekọta otu ha ruo oge a Man Utd ga-ahọpụta onye ga-anọchite Jose Mourinho ha chụrụ achụ.

@MxZVGx_ kwuru na Man Utd achakeela ka ọnwa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọ bụkwa mbụ ha na-enye goolu ise n'ime otu egwuregwu Premier League kemgbe Alex Ferguson rituru n'oche nchịkọta ha na 2013.

@ebuka_akara kwuru sị na Man Utd kwesịrị ịga gbubiri oke ha n'ego a kwụrụ Mourinho oge ọ na-apụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ajụjụ bụzị "Mourinho ọ bụbu agada gbachiri ụzọ nye ha?"

Chelsea zutere Leicester City:

Ebe Wilfred Ndidi na Kelechi Iheanachọ bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Leicester City bọọlụ ga-arahụ ụra ọfụma n'abalị a, nwanne ha nwoke bụ Victor Moses ga-anọ n'echiche maọbụ buru ọnụ laba.

Ị na-ajụ ihe kpatara nke a?

Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụ makana Leicester City ji otu ọkpụ goolu merie Chelsea na Stamford Bridge bụ be ha.

Chelsea na onwe ha riri ihe ruru goolu anọ, mana goolu Jamie Vardy nyere na nkeji 51, mere ka ndị na-akwado Leicester City hụ ihe ha ga-eji enwe aṅụrị.

@EnekemGreg kwuru na o cheghị na a ga-emeri Chelsea n'egwuregwu a:

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@SirVee kwuru na oge eruola mgbe Sarri bụ onye nchịkọta Chelsea ga-agbanwe ndị ọ na-eji ebido bọọlụ.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Manchester City na Crystal Palace:

Mmeri e meriri Man City juru ndị mmadụ anya, makana ọ dịzị ka ha esi n'elu tebulu kụọ afọ n'ala.

Pep Guardiola

Ebe foto si, Getty Images

Crystal Palace nọ n'ọkwa 14 ji goolu atọ a satara abụọ merie Man City n'ogige egwuregwu Etihad bụ be ha.

N'agbanyeghị na Ilkay Gundogan bu ụzọ nye goolu na nkeji 27, ụkwụ esighi Man City ike, ruo mgbe Kevin de Bruyne nyere ọzọ na nkeji 85.

Ndị Man City

Ebe foto si, Getty Images

Mana nke ahụ azọghị ha n'aka ndị Crystal Palace.

Goolu Jeffrey Schlupp nyere na nkeji 33, nke Andros Townsend nyere na nkeji 35 na nke Luka Milivojevic ji penariti nye na nkeji 51, nyere Crystal Palace mmeri na-agụ ha kemgbe.

@subashpoudel918 kwuru na Liverpool nwekwara ibuli iko Premier League nke afọ a maka mmeri Crystal Palace meriri Man City.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Arsenal na Burnley:

Obi na-atọ ndị na-akwado Arsenal pọlịna pọlịna ka ha gbara Burnley ọkpụ atọ asatara otu n'ogige egwuregwu Emirates bụ be ha.

Iwobi na ndị otu ya na-aṅụrị

Ebe foto si, Getty Images

Mmeri a ga-eme ka ha chefuo etu onye ọbụla si kpụrụ ha n'ọnụ ka Southampton na Liverpool nyeruchara ha goolu atọ atọ oge ha zutere n'izu gara aga.

Alexander Iwobi bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Arsenal ga-arahụ ụra ka nwa a mụrụ ọhụrụ, ọkachasị nke a o so na ndị mere ihe ha ji nweta mmeri.

Pierre-Emerick Aubameyang bu uzọ nye goolu na nkeji 14 na 48, Ashley Barnes nke Burnley sara ya na nkeji 63, mana goolu Iwobi nyere na nkeji 90 na ụma, mere ka Burnley bụrụ ndị a gbawara obi taa.

Aubameyang kwuru na goolu ya bụ onyinye o ji agbara ndị Arsenal ekeresimesi.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

Akụkọ ga-amasị gị: