Liverpool vs Arsenal: Onye ga-ehicha Iwobi na ndị otu ya anyammiri?

Iwobi na Lovren

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọ na-akpọtụ ebe niile maka etu Liverpool si were ọkpụ goolu ise asatara otu nyụọ Arsenal anya n'asọmpi Premier League taa.

Ka onye ọbụla nọ n'ime mmụọ e ji agba ekeresimesi ma na-eche afọ ọhụrụ, ndị Arsenal anaghị enwetya onwe ha maka "mkparị" Liverpool kparịrị ha.

Goolu atọ Roberto Firminho nyere na nkeji 14, 16 na 65, na nke Sadio Mane nyere na nkeji 32 nakwa nke Mohamed Salah ji penariti nye na nkeji 45 na ụma, kụnyere ntu dị n'akpati ozu ndị Arsenal.

N'agbanyeghị na Arsenal bu ụzọ nye goolu si n'aka Ainsley Maitland-Niles na nkeji 11, o zughi ịzọpụta ha n'aka ihe mgbu Liverpool kwadoro ha n'ọgbọ egwuregwu Anfield.

Mmeri Liverpool meriri Arsenal mere ka ha jiri pọịntị itoolu nọrọ n'elu tebulu Premier League.

Onye Liverpool na-enyere onye Arsenal aka

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ndị mmadụ na-ekwu:

Otiegwu a ma dịka Ruggedman kwuru sị na obi ga-adị ndị Arsenal ka ha kwụọ ụdọ:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@otoiks kwuru na Liverpool ji ụtalị pịakasịa Arsenal ahụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@morakcares kwuru sị na ọ ga na-akwado Arsenal ma na mmeri ma mgbe e meriri ha.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3