Rohr: Igbagbu Poland apụtaghị ịbụ ọkaibe

Ebe foto si, Getty Images
Rohr kwuru na ọ bụ sọọsọ na Naịjiria agara n'ihu itinye uchu na ihaziharị egwuregwu bọọlụ ka ha ga-enweta ezi uru pụrụ iche na'asọmpi iko mba ụwa.
Naijiria nyere mba Polond otu ọkpu asataghị ihe na egwuregwu enyi na enyi ha gbara na Poland abalị Fraide.
Onye nchịkọta otu Super Eagles Naijiria kwuru na ọ bụghị imeri otu egwueregwu abụọ sọ na ịrị kachasi mara agba bọọlụ d(dịka FIFA jiri gụọ ya) bụ na Naịjiria ga-abụ ọkaibe na ikọ mba ụwa.
Rohr onye kwuru na ọ bụ ụmeala na ịrụsi ọrụ ike nke ndị otu egwureegwu Naịjiria mere ha ji merie, dụrụ ha ọdụ ka ha ga n'ihu idi umeala ma rụsie ọrụ ike.
Ọ bụ Victor Moses bụ onye jị penaliti nye gool n' asọmpi ahụ.






