Popu Leo XIV ekwuola na ụlọụka kwesiri inweta ihe n'ebe ọchịchịrị dị

Popu Leo XIV yi uwe ọcha na okpu oge ọ kaara ndị Kadịnal ụka n'ụlọụka Sistine Chapel ụbọchị Fraịde, 9, Mee 2025

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Oge Popu Leo XIV, Popu mbụ si mba Amerịka na-ezi ozi ọma n'ụka mbụ ya dịka Popu ụbọchị Fraịde 9, Mee, 2025.
    • Onye dere ya, Frances Mao
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Popu Leo XIV anọrọla n'ụka mass mbụ ya na Vatịkan dịka Popu ọhụrụ ụka Katọlik kpọọ oku ka ndị ụka Katọlik niile gbaa mbọ megide enweghị okwukwe.

Okwu ya na-abịa otu abalị a họpụtara dịka Popu nke 267 nakwa onye Amerịka mbụ ga-abụ onyeisi ụka Katọlik. Ọ gwara ndị ụka ka ha makụọ okwukwe ma ghara ụfọdụ ihe mmepụta teknụzụ, ịchụ ego, ike nakwa ihe ndị ọzọ na-amasị anụ ahụ ha.

Popu Leo XIV kwuru na a họpụtara ya dịka onye okwukwe ga-edu ụka ga-enweta ihe nye ọchịchịrị ọbụla dị n'ụwa.

Ihe ruru mmadụ otu ijeri na ụma anọ bụ ndị ụka Katọlik ji oke ọṅụ nabata nhọpụta Robert Francis Prevost dịka Popu ọkachasị na mba ya Amerịka na Peru ebe ọ rụrụ ọrụ ruo afọ iri abụọ (20).

N'ozi ọma ya ụbọchị Fraịde, 9, Mee, 2025, Popu Leo XIV kwuru na ọ dị mkpa ka e nwee ije ozi ọma iji nweta mgbanwe n'ọtụtụ ihe ọ kọwara na-ekwesịghị ekwesi na-eme n'ụwa ugbua dịka oke ịchụ ego, mmepụta teknụzụ, inweta ike nakwa ihe ndị ọzọ.

"Enweghị okwukwe na-enweta ịla n'iyi na ịda mba na ndụ mmadụ, enweghị ugwu nye amara, ịmetọ ikike mmadụ, ọgbaaghara n'ezinaụlọ nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-emetụta ụwa anyị nọ na ya taa," bụ ihe o kwuru n'ozi ọma nke o ziri n'asụsụ Ịtalian

Popu Leo gbara afọ 69, yi uwe ọcha eji ọlaedo jaa mma dịka ọ na-agwa ndị kadịnal okwu n'ụlọụka Sistine Chapel.

N'okwu ya tupu ọ malite ozi ọma ya, Popu Leo XIV kpọrọ oku ịdị n'otu n'aka ndị kadịnal, ọ gwara ha n'asụsụ bekee Amerịka y: E nwere m ntụkwasiobi ebe unu nọ iji nyere m aka rụọ ọrụ a".

Ndị Kadịnal oge Popu Leo XIV n'ụka mbọ ya dịka Popu n'ụlọụka Sistine Chapel n'ụtụtụ Tọzde 8 Mee, 2025

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị Kadịnal oge Popu Leo XIV n'ụka mbọ ya dịka Popu n'ụlọụka Sistine Chapel n'ụtụtụ Tọzde 8 Mee, 2025

Ka ọtụtụ izuụka gara, onye a maara na mbụ dịka Prevost, ka e kwupụtara dịka Popu ụka Katọlik ụbọchị Tọzde 8 Mee, 2025 na St Peter's Square.

Ọtụtụ puku ndị ụka gbakọrọ na St Peter's Square tiri mkpu ọṅụ oge anwụrụ ọkụ ọcha pụtara na igwe chimney Vatịkan n'ime abalị abụọ ntuliaka conclave malitere.

Ka obere ego gara, Prevost bụ onye Chikago mba Amerịka, pụtara na balkọni St Peter's Basịlịka. N'okwu mbụ ọ gwara igurube mmadụ ahụ, o kwuru na o nwere ebumnobi "ụka ozi ọma nke na-awụlite udo, mmekọ na ọganihu".

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ gara n'ihu kwuo ma kwado oku Popu Francis lara mmụọ na-akpọ maka udo.

"Nyere anyị aka, nyere ibe gị aka, kwalite nkwekọrịka, jikọọaka ọnụ dịka otu ndị na udo," ka o kwuru.

Ndị ndu mba dị iche iche nakwa otu okpukperechi e nwere na mbaụwa ezigarala Popu Leo XIV a họpụtara ọhụrụ ozi ekele ha ma kwe nkwa inyere ya aka n'ọrụ ya iji nweta udo.

Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump akọwaala ya dịka "nnukwu nkwanyeugwu" inwe Popu si mba Amerịka.

E chiri Prevost bụbu Bishọpụ Chiclayo na Peru, archbishọpụ na kadịnal n'afọ2023.

Ndị kadịnal ibe ya họpụtara na ntuliaka e kwuru ruru agba anọ na emume ntuliaka nzuzo kọnklave e mere ka ọnwụ Popu Francis mere izuụka abụọ.

A na-ahụta ya dịka onye nwere ụdịrị echiche Popu Francis lara mmụọ, onye a hụtara dịka onye na-akwado ikike mmadụ, ndị ogbenye ma bụrụ onye gbara mbọ inweta agamnihu ụka Katọlik.

Ndị mmadụ na Vatịkan na-ekwu na ọ dịka Popu Francis kpọtara Prevost na Rome n'ime afọ ole na ole gara aga iji kwadoo ya dịka onye ga-anọchi ya dịka Popu.

Prevost bụ onye otu Augustinian mishọnarị ma rụọ ọrụ maka ndị ogbenye na ndị a na-akpagbu na mba Peru ebe o nwetara akwụkwọ njirimara mba ahụ n'afọ 2025.

Oge ọ bụ Kadịnal Prevost, ọ katọrọ ọchịchị Onyeisiala Trump na-achị Amerịka nakwa atụmatụ ya ịmachi ndị mmadụ ịbata Amerịka.

N'ozi o wepụtara n'ọnwa Febụwarị, ọ katọrọ Osote Onyeisiala JD Vance maka ikwu na ndị ụka Kraịst kwesiri ihụ naanị ezinaụlọ ya, ndị agbataobi, ndị obodo ya nakwa ndị ọzọ n'usoro ahụ, Popu Leo kwuru na "ihe JD Vance abụghị eziokwu: Jizọs ekwughị usoro e si ahụ mmadụ ọzọ n'anya.